Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 11:6 - Bible Nso

6 Jehova we sim, Kpọsa okwu ndia nile n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem, si, Nurunu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a, me kwa ha.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Onyenwe anyị sịrị m, “Kpọsaa okwu ndị a nʼobodo Juda niile, na nʼokporoụzọ Jerusalem niile, ‘Geenụ ntị nʼiwu nke ọgbụgba ndụ ahụ, ma mezuo ihe o kwuru.

See the chapter Copy




Jeremaya 11:6
13 Cross References  

Ọ nyeghi ego-ya inara uma, Ọ naraghi kwa ihe-iri-ngo megide onye nēmeghi ihe ọjọ. Onye nēme ihe ndia, agaghi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi.


Were akpiri kpọ nkpu, eb͕ochila, welie olu-gi dika opì-ike, we gosi ndim njehie-ha, gosi kwa ulo Jekob nmehie-ha.


purue ndagwurugwu nwa Hinom, nke di n'oghere ọnu-uzọ-ama ejùjù, kpọsa n'ebe ahu okwu nile nke M'gāgwa gi:


Je, kpọ òkù na nti nke Jerusalem, si, Otú a ka Jehova siri, Echetawom n'ebe i nọ ebere nke mb͕e i nọ na nwata, ihu-n'anya nke mb͕e aluru gi ọhu: otú i jesorom n'ọzara, n'ala anāghaghi nkpuru.


Je, kpọsa okwu ndia n'uzọ Ugwu, si, Lata, gi Israel nke nādaghachi azu, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; M'gaghi-edo unu iru iwe: n'ihi na onye-ebere ka M'bu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gaghi-edebe iwe rue mb͕e ebighi-ebi.


Guzo n'ọnu-uzọ-ama ulo Jehova, we kpọsa okwu a n'ebe ahu, si, Nurunu okwu Jehova, unu Juda nile, ndi nābà n'ọnu-uzọ-ama ndia ikpọ isi ala nye Jehova.


Ùnu agaghi-anu okwu nile nke Jehova kpọsaworo site n'aka ndi-amuma mbu, mb͕e Jerusalem bu ebe madu bi, mb͕e ọ nọ kwa n'udo, mb͕e madu bi kwa n'obodo-ya nile di ya buruburu na nime Negeb na n'ebe di ala ala?


Ọ buru na unu matara ihe ndia, ngọzi nādiri unu ma asi na unu nēme ha.


n'ihi na ọ bughi ndi nānu iwu bu ndi ezi omume n'ebe Chineke nọ, kama ọ bu ndi nēdebe iwu ka agāgu na ndi ezi omume:


Ma ub͕u a, Israel, ge nti ukpuru nile, ge kwa nti ikpé nile, nke mu onwem nēzí unu, ime ha; ka unu we di ndu, we ba, nweta kwa ala ahu nke Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, nēnye unu.


Le, ezíwom unu ukpuru di iche iche na ikpé di iche íche, dika Jehova, bú Chinekem, nyerem iwu, ka unu we me otú a n'etiti ala ahu ebe unu onwe-unu nābà inweta ya.


Ma ghọnu ndi nēme okwu ahu, unu abu-kwa-la ndi nānu nání, ndi nārafu onwe-unu.


Follow us:

Advertisements


Advertisements