Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 11:22 - Bible Nso

22 n'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji si otú a, Le, M'gaje iwere nmehie-ha leta ha: umu-okorọbia-ha gānwu site na mma-agha; umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom gānwu site n'oké unwu;

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Nʼihi nke a Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, sị, “Aga m ata ha ahụhụ. Ụmụ okorobịa ha ga-anwụ site na mma agha, ụnwụ ga-egbukwa ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom.

See the chapter Copy




Jeremaya 11:22
9 Cross References  

O we me ka eze Kaldea rigokwasi ha, o we were mma-agha b͕ue umu-okorọbia-ha n'ulo ebe nsọ ha, o nweghi kwa ọmiko n'aru nwa-okorọbia, ma ọbu n'aru nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, ma-ọbu n'aru okenye, ma-ọbu n'aru onye kara nká: ha nile ka O nyere n'aka-ya.


N'ihi nka were umu-ha nye oké unwu, rara kwa ha nye n'aka mma-agha; ka ndinyom-ha ghọ kwa ndi b͕ara aka nwa na ndi di-ha nwuru; ka ndikom-ha ghọ kwa ndi ọnwu b͕uru, ka umu-okorọbia-ha ghọ ndi etib͕uru na mma-agha n'agha.


M'gēwere kwa nmehie-unu leta unu dika nkpuru omume nile unu si di, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): M'gēsuye kwa ọku n'oké ọhia-ya, ọ gērichapu kwa ihe nile di ya buruburu.


M'gēji kwa nmehie nke ndi bi n'ala Ijipt leta ha, dika M'jiworo nmehie nke Jerusalem leta ya, site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe:


N'ihi nka ka umu-okorọbia-ya gāda n'amá-ya nile, ọ bu kwa ndi-agha-ya nile ka agēme ka ha dere du n'ubọchi ahu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


N'ihi na ọnwu arigobatawo na window nile nke ayi, ọ batawo n'ulo-elu nile nke ayi; ibipu umu-ntakiri n'èzí, na umu-okorọbia n'amá nile.


Nwa-okoro na agadi-nwoke edinawo ala n'èzí nile; Umu-ab͕ọghọm nāmaghi nwoke na umu-okorọbiam adawo site na mma-agha: I b͕uwo ha n'ubọchi iwe-Gi; I b͕usiwo, I nweghi ọmiko.


Ezitewom ajọ ọria nēfe efe n'etiti unu n'uzọ o si eme n'Ijipt: eb͕uwom umu-okorọbia-unu na mma-agha, ha na inyinya nile unu adọtara n'agha; M'we me ka ísì ọjọ nke ọmuma-ulo-ikwū-unu rigota ọbuná n'imi-unu: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Follow us:

Advertisements


Advertisements