Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 11:16 - Bible Nso

16 Osisi olive di ndu, nke mara nma n'imì nkpuru ọma, otú a ka Jehova kpọrọ aha-gi: n'olu nkpọtu uku ka O suyeworo ya ọku, alaka-ya nile anyakasiwo kwa.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Aha Onyenwe anyị nyere gị bụ Osisi oliv dị ndụ, nke na-amị mkpụrụ mara mma. Ma ọ bụ olu mkpọtụ nke oke mmiri ozuzo ka ọ ga-eji mụkwasị gị ọkụ; alaka gị ga-agbajisikwa.

See the chapter Copy




Jeremaya 11:16
18 Cross References  

Dika osisi ndu ka ọ di n'iru anyanwu, Ome-ya nēpusa n'ubi-ya ab͕ara ogige.


Ma mu onwem, adim ka osisi olive nwere akwukwọ ndu n'ulo Chineke: Atukwasiwom obi n'ebere Chineke rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Esurewo ya n'oku, eb͕utuwo ya: Site n'ibasi-nba-ike nke iru-Gi ha nāla n'iyì.


Ka aka-Gi di n'aru nwoke nke aka-nri-Gi, N'aru nwa nke madu onye I mere ka o nwere Gi ume.


N'ihi na, le, ndi-iro-Gi nāb͕a aghara: Ọzọ, ndi nākpọ Gi asì ebuliwo isi-ha.


Mb͕e ngalaba-ya kpọnwuru akpọnwu, agānyajipu ha; ndinyom abia sure ha ọku: n'ihi na ọ bughi ndi nwere nghọta ka ọ bu; n'ihi nka Onye meworo ya agaghi-enwe obi-ebere n'aru ya, Onye kpuworo ya agaghi-emere ya amara.


Ma Mu onwem kuru gi-ri osisi vine kachasi nma, nkpuru nke bu nání ihe ziri ezi: ì si kwa aṅa b͕anwe orù osisi vine nke ala ọzọ n'ebe M'nọ?


M'gēwere kwa nmehie-unu leta unu dika nkpuru omume nile unu si di, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): M'gēsuye kwa ọku n'oké ọhia-ya, ọ gērichapu kwa ihe nile di ya buruburu.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, iwem na ọnumam ka anāwusi n'ebe a, n'aru madu, na n'aru anu-ulo, na n'aru osisi ọhia, na n'aru nkpuru nke ala-ubi; ọ gēre kwa ọku, agaghi-emenyu kwa ya.


Ome-ya nile gāwasa, ima-nma-ya gādi kwa ka osisi olive, ísì ọma o nēsì gādi ka Lebanon.


Ma ọbuná ub͕u a anātukwasi anyu-ike na nkpọrọgwu osisi nile: ya mere anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku.


Ọ buru na onye ọ bula anọgideghi nimem, atupu ya n'èzí dika alaka, ọ kpọnwu kwa; ha we chikọta ha, tubà ha n'ọku, ewe rechapu ha ọku.


I gēnwe osisi olive n'ókè-ala-gi nile, ma ọ dighi manu i gēte; n'ihi na nkpuru olive gi gādakwosi.


Ndia bu osisi olive abua ahu na ihe-idọba-oriọna abua ahu, ndi nēguzo n'iru Onye-nwe uwa.


Follow us:

Advertisements


Advertisements