Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 11:12 - Bible Nso

12 Obodo nile nke Juda na ndi bi na Jerusalem gēje kwa tikuru chi nile nke ha onwe-ha nēsurere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ: ma ọ dighi nzọputa ma-ọli ha gāzọputa ha na mb͕e ihe ọjọ ha.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ndị obodo Juda na ndị bi na Jerusalem ga-apụ kpọkuo chi ndị ahụ niile ha na-achụrụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, ma chi ndị a agaghị enyere ha aka mgbe mbibi a bịakwasịrị ha.

See the chapter Copy




Jeremaya 11:12
10 Cross References  

Ma na mb͕e nkpab͕u ahu akpab͕uru ya, o mekpuru emekpu kari imegide Jehova, bú eze Ehaz nka.


Chikọtanu onwe-unu, bia; biarunu nso n'otù, unu ndi mba nile b͕aputara ab͕aputa: ha amaghi ama, bú ndi ahu nēbu osisi arusi-ha apiri api, ndi nēkpe-kwa-ra chi nādighi-azọputa.


Ha nēbuli ya n'ubu, n'ebu ya, we dọba ya n'ọnọdu-ya, o we guzo; ọ gaghi-esi n'ebe-ya pua: e, madu gētiku ya nkpu, ma ọ gaghi-aza, ọ gaghi-azọputa ya n'ahuhu-ya.


N'ihi na ndim echezọwom, ihe-efu ka ha sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nye; ha we me ka ha su ngọngọ n'uzọ nile ha, bú uzọ-ije nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, ije ije n'okporo-uzọ di iche iche, bú uzọ anātulighi atuli;


Ma òle ebe chi-gi nile nke i meworo nye onwe-gi nọ? ka ha bilie, ọ buru na ha gāzọputa gi na mb͕e ọnọdu ọjọ gi: n'ihi na dika ọnu-ọgugu obodo-gi nile si di, otú a ka chi-gi nile di, Juda.


n'iji ọlu nile nke aka-unu kpasuem iwe, n'isurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ala Ijipt, ebe unu onwe-unu biaworo inọ dika ọbìa; ka ewe bipu unu, ka unu we ghọ kwa ihe-nkọcha na ihe-ita-uta n'etiti mba nile nke uwa?


Ọ gāsi kwa, Òle ebe chi nile ha nọ? Bú oké nkume nke ha b͕abàra nime ya;


Nke nēri abuba àjà nile ha, Nāṅu kwa manya-vine nke àjà-ihe-ọṅuṅu-ha; Ka ha bilie, yere unu aka, Ka ọ buru ebe-nzuzo n'elu unu.


Jenu, tikue chi ndi unu rọputaworo; ka ha onwe-ha zọputa unu na mb͕e nkpab͕u-unu.


Follow us:

Advertisements


Advertisements