Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 10:21 - Bible Nso

21 N'ihi na ndi-ọzùzù-aturu aghọwo anu-ọhia, ma Jehova ka ha nājughi ase: n'ihi nka ha enweghi uche, aturu nile ha nāzù we b͕asa.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Nʼihi na ndị ọzụzụ atụrụ a enweghị uche. Ha adịghị ajụta ase site nʼaka Onyenwe anyị, ya mere, na ihe adịghị agara ha nke ọma, igwe atụrụ ha niile agbasasịakwala.

See the chapter Copy




Jeremaya 10:21
18 Cross References  

Nání anu-ọhia ka madu ọ bula ghọworo site n'ihe-ọmuma-ya; emewo ka ihere me onye-nnucha-ọla ọ bula site n'arusi-ya apiri api: n'ihi na okwu-ugha ka arusi-ya awuru awu bu, nku-ume adighi kwa nime ha.


Ma ha nile n'otù bu anu-ọhia na ndi-nzuzu: idọ-aka-na-nti nke ihe-efu, nání osisi ka ọ bu.


Ọtutu ndi-ọzùzù-aturu ebibiwo ubi-vine nkem, ha azọdawo òkèm, ha emewo òkèm anāchọsi ike ka ọ ghọ ọzara tọb͕ọrọ n'efu.


Ndi-nchu-àjà asighi, Òle ebe Jehova nọ? ọzọ, ndi ji iwum eme ihe amaghm: ndi-ọzùzù-aturu jehie-kwa-ra megidem, ndi-amuma ji-kwa-ra Beal bu amuma, ọ bu kwa ihe nādighi-abà urù ka ha jesoro.


Otú a ka Jehova siri, Denu nwoke a n'akwukwọ na ọ bu onye b͕a aka nwa, bú nwoke nke ihe nāgaghi-agara nke-ọma n'ubọchi-ya nile: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nime nkpuru-ya ihe gāgara nke-ọma, nke ganānọkwasi n'oche-eze Devid, nāchi kwa achi ọzọ na Juda.


Camel nile ha gāghọ kwa ihe-nluta-n'agha, ìgwè anumanu-ha gāghọ kwa ihe-nkwata: M'gēfesa-kwa-ra ifufe nile ndi akọpuworo usọ isi-ha; ọ bu kwa n'ofè-ya nile ka M'gēme ka nhuju-anya-ha si bia; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


ndi-amuma ebuwo amuma ugha, ndi-nchu-àjà nāzọda kwa ndim site n'aka-ha; ndim ahuwo kwa ihe di otú a n'anya: ma gini ka unu gēme n'ikpe-azu-ya?


Aturu nke emeworo ka ọ wagharia ka Israel bu; ọdum di iche iche achupuwo ya: ọdum nke-mbu, bú eze Asiria, ripiara ya; ma ọdum ikpe-azu a, bú Nebukadreza eze Babilon, ab͕ajiwo ọkpukpu-ya nile.


Ihere emewo ndi mara ihe, ha atuwo ujọ, ewe jide ha: le, okwu Jehova ka ha juworo; ọ̀ bu kwa aha amam-ihe gini ka ha nwere?


Dika onye-ọzùzù-aturu si achọputa ìgwè aturu-ya, n'ubọchi ọ nọ n'etiti ìgwè ewu na aturu-ya nke b͕asara ab͕asa, otú a ka M'gāchọputa ìgwè ewu na aturu nkem; M'gānaputa kwa ha n'ebe nile ha b͕asara n'ubọchi nke igwe-oji na oké ọchichiri.


N'aru ndi-ọzùzù-aturu ka iwem di ọku, ọ bu kwa nkpi nile ka M'gēji nmehie-ha leta: n'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha eletawo ìgwè ewu na aturu-Ya, bú ulo Juda, Ọ gēme kwa ha ka ha di ka inyinya-Ya di ebube n'agha.


Teta, gi mma-agha, imegide Onye-ọzùzù-aturum, na imegide nwoke ahu nke bu ibem, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta): tib͕ue Onye-ọzùzù-aturu ahu, agāb͕asa kwa ìgwè ewu na aturu; M'gēchighari kwa akam imegide ndi ntà.


Follow us:

Advertisements


Advertisements