Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 10:2 - Bible Nso

2 Otú a ka Jehova siri, Unu amutala uzọ mba nile, unu atu-kwa-la ujọ ihe-iriba-ama di iche iche nke elu-igwe; n'ihi na mba nile nātu ujọ ha.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Unu amụtala ụzọ ndị mba ọzọ, unu atụkwala ụjọ ihe ịrịbama niile nke na-apụta ihe na mbara eluigwe, ọ bụ ezie na ndị mba dị iche iche na-atụ ha ụjọ.

See the chapter Copy




Jeremaya 10:2
10 Cross References  

Chineke we si, Ka ihe nke nēnye ihè di na mbara elu-igwe ikpa ókè n'etiti ehihie na abali; ka ha buru kwa ihe igosi ihe-iriba-ama di iche iche, na igu mb͕e akara àkà, na igu ubọchi na arọ:


Nurunu okwu Jehova gwaworo unu, unu ulo Israel:


ma ihe ahu nke nābà nime mọ-unu, ọ gaghi-adi ma-ọli; ọ bu na unu onwe-unu nāsi, Ayi gādi ka mba nile, dika ab͕uru nile nke ala nile, ijere osisi na nkume ozi.


Unu emela dika omume ala Ijipt, nke unu biri nime ya: unu eme-kwa-la dika omume ala Kenean, nke Mu onwem nēme ka unu ba n'ebe ahu: unu ejeghari-kwa-la n'ukpuru nile ha.


Unu ejeghari-kwa-la n'ukpuru nile nke mba ahu, nke Mu onwem nāchupu n'iru unu: n'ihi na ihe ndia nile ka ha mere, ike ha we gwusiam.


Mb͕e gi onwe-gi nābà n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, amutala ime dika ihe-árú nile nke mba ahu nile si di.


M'we si unu, Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu; unu atula egwu chi nile nke ndi-Amorait, ndi unu onwe-unu bi n'ala-ha: ma unu egeghi nti olum.


Follow us:

Advertisements


Advertisements