Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 10:19 - Bible Nso

19 Ahuhu dirim bayere nb͕aji ukwu na akam! ọnyám nke etiputa jọrọ njọ: ma mu onwem siri, N'ezie nka bu ọriam, m'gēburu kwa ya.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Ahụhụ dịịrị m nʼihi mmerụ ahụ m merụrụ. Ọnya dị m nʼahụ enweghị ọgwụgwọ. Ma ana m akasị onwe m obi na-asị, “Nʼezie, ọrịa a dakwasịrị m bụ ọrịa m, aga m edikwa ya.”

See the chapter Copy




Jeremaya 10:19
17 Cross References  

Aghọrọm onye-ob͕i, adighm-asaghe ọnum; N'ihi na Gi onwe-gi mere ya.


M'we si, Ọriam ka nka bu; Ma m'gēcheta arọ nile nke aka-nri nke Onye kachasi ihe nile elu.


M'gēchere kwa Jehova, Nke nēzonari ulo Jekob iru-Ya, m'gēle kwa anya Ya.


I gāgwa kwa ha okwu a, si, Ka anya-miri si n'anyam erùda abali na ehihie, ka ha ghara kwa iguzo du; n'ihi na nb͕aji ukwu na aka di uku ka ejiworo b͕aji ada ndim nāmaghi nwoke, ọ bu ntiputa-ọnyá nke jọrọ njọ nke-uku.


Ọ bu ezie na ajọ omume-ayi azawo megide ayi, ma Gi lua olu n'ihi aha-Gi, Jehova: n'ihi na ndaghachi-azu-ayi di ọtutu; Gi ka ayi mehieworo megide.


olile-anya Israel, ka Jehova bu, ihere gēme ndi nile nārapu Gi: ndi nēsi n'ebe M'nọ wezuga onwe-ha, n'ala ka agēde ha, n'ihi na ha arapuwo isi-iyi nke miri nēnye ndu, bú Jehova.


Ngiri-afọm, ngiri-afọm! anamab͕ali na mb͕idi nile nke obim; obim nāsu udè nke-uku nimem; adighm-ab͕a nkiti; n'ihi na olu opì-ike ka i nuworo, nkpuru-obim, bú udà-opì agha.


N'ihi na olu dika nke nwanyi ime nēme ka m'nuworo, ihe-nb͕u dika nwanyi nāmu nwa mbu ya, bú olu nke ada Zaion, o nēku ike ike, ọ nāb͕asa ọbu-aka-ya abua, si, Ahuhu dirim nọ̄! n'ihi na nkpuru-obim nāda #mbà n'iru ndi-ob͕u-madu.


N'ihi nb͕aji ukwu na aka nke ada ndim ka ab͕ajiworom ukwu na aka: anameyi uwe-nkpe; iju-anya ejidesiwo m ike.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na isim bu miri miri, asi anyam abua bu isi-iyi nke anya-miri, ka m'we kwa ákwá n'ehihie na abali bayere ndi eb͕uru eb͕u nke ada ndim!


Ọ nākwasi ákwá ike n'abali, anya-miri-ya di kwa na ǹtì-ya abua; Ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere n'etiti ndi nile nāhu ya n'anya: Ndi-eyì-ya nile aghọb͕uwo ya, Ha aghọworo ya ndi-iro.


Ọtutu iyi nke juputara na miri ka anyam nērùda, n'ihi ntipia nke ada ndim.


Iwe di ọku nke Jehova ka m'gēbu, n'ihi na emehiewom megide Ya; rue mb͕e Ọ gēkpe ọnum, me ihe ekpere n'ikpem, Ọ gēme ka m'puta n'ìhè, m'gēlekwasi kwa ezi omume-Ya anya.


Follow us:

Advertisements


Advertisements