Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 1:3 - Bible Nso

3 O ru-kwa-ra ya nti n'ubọchi Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, rue mb͕e arọ nke-iri-na-otù nke Zedekaia nwa Josaia, bú eze Juda, gwusiri: rue mb͕e emere ka Jerusalem je biri n'ala ọzọ n'ọnwa nke-ise.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ozi ndị ọzọ rukwara ya ntị nʼoge Jehoiakim nwa Josaya, bụ eze Juda, ruokwa nʼọnwa nke ise nʼafọ nke iri na otu nke Zedekaya nwa Josaya, bụ eze Juda kwụsịrị, mgbe a dọkpụụrụ ndị Jerusalem nʼagha buru ha ka ha gaa biri na mba ọzọ.

See the chapter Copy




Jeremaya 1:3
19 Cross References  

Fero-neko we me Elaiakim nwa Josaia eze n'ọnọdu Josaia nna-ya, gugharia ya aha Jehoiakim: ma o wepuru Jehoahaz; ọ biarue Ijipt, nwua n'ebe ahu.


Eze Babilon we me Matanaia nwa-nne nna-ya eze n'ọnọdu ya, gughari kwa ya aha Zedekaia.


Umu-ndikom Josaia kwa; ọkpara-ya Johanan, nke-abua Jehoiakim, nke-atọ Zedekaia, nke-anọ Shalum.


Okwu Jehova we ruem nti, si,


Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e Nebukadneza, bú eze Babilon, na usu-ndi-agha-ya nile, na ala-eze nile nke uwa nke aka-ya nāchi, na ndi nile di iche iche, nēbuso Jerusalem, nēbuso kwa obodo-ya nile, agha, si:


Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site Jehova n'ubọchi Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, si,


Were n'onwe-gi akwukwọ-npiakọta, de nime ya okwu nile nke M'gwaworo gi imegide Israel, na imegide Juda, na imegide mba nile, site n'ubọchi M'gwara gi okwu, site n'ubọchi Josaia, we rue ta.


n'arọ nke-iri-na-otù nke Zedekaia, n'ọnwa nke-anọ, n'ubọchi nke-iteghete nke ọnwa ahu, ka awapuru n'obodo ahu:)


Gwa ndi nile nke ala nka, gwa kwa ndi-nchu-àjà, okwu, si, Mb͕e unu buru ọnu, mb͕e unu tiri aka n'obi n'ọnwa nke-ise, na n'ọnwa nke-asa, ọbuná ọgu arọ atọ na iri ndia, ọ̀ bu obubu-ọnu unu buru ma-ọli nye Mu onwem?


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Obubu-ọnu nke ọnwa nke-anọ, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-ise, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-asa, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-iri, gāghọrọ ulo Juda obi-utọ na ọṅù, na mb͕e akara àkà di nma; hu-kwa-nu ezi-okwu na udo n'anya.


Follow us:

Advertisements


Advertisements