Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 1:1 - Bible Nso

1 Okwu Jeremaia nwa Hilkaia, onye sitere na ndi-nchu-àjà ndi nọ n'Anatot n'ala Benjamim:

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ndị a bụ okwu Jeremaya nwa Hilkaya, bụ otu onye nʼime ndị nchụaja, nọ nʼAnatot nke dị nʼala Benjamin.

See the chapter Copy




Jeremaya 1:1
23 Cross References  

Eze we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, La n'Anatot, rue ubi-gi; n'ihi na nwoke kwesiri ọnwu ka i bu: ma m'gaghi-eme ka i nwua n'ubọchi ta, n'ihi na i būru ib͕e Onye-nwe-ayi Jehova n'iru Devid, bú nnam, na n'ihi na ewedara gi n'ala n'ihe nile nke ewedara nnam n'ala nime ya.


site kwa n'ebo Benjamin; Geba na ebe-ita-nri-ya nile, na Alemet na ebe-ita-nri-ya nile, na Anatot na ebe-ita-nri-ya nile. Obodo-ha nile bu obodo iri na atọ n'ab͕uru-ha nile.


Jeremaia we bùara Josaia abù-ákwá: ndi-abù ndikom na ndi-abù ndinyom nile we nēkwu okwu bayere Josaia rue ta n'abù-ákwá-ha; ha we tiye ha ibu ukpuru n'ebe Israel nọ: ma, le, edewo ha n'akwukwọ abù-ákwá.


o me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, bú Chineke-ya; o rurughi ala n'iru Jeremaia, bú onye-amuma, onye nēkwu okwu site n'ọnu Jehova.


imezu okwu Jehova nke sitere n'ọnu Jeremaia, rue mb͕e ubọchi-izu-ike-ya nile tọsiri ala ahu utọ: ubọchi nile nke ntọb͕ọrọ-n'efu-ya ọ kwusiri ọlu, imezu ọgu arọ atọ na iri.


Ma n'arọ mbu nke Sairọs, bú eze Peasia, ka okwu Jehova nke sitere n'ọnu Jeremaia we rè, Jehova kpọtere mọ nke Sairọs, bú eze Peasia, o we kwusa n'ala-eze-ya nile, ọzọ kwa, o tiyere ya n'odide-akwukwọ, si,


Ndikom Anatot, ọgu isi na asatọ.


Ọhù Aisaia nwa Emoz, nke ọ huru bayere Juda na Jerusalem n'ubọchi Uzaia na Jotam na Ehaz na Hezekaia, bú ndi-eze Juda.


Were olu-gi tisie nkpu ike, ada Galim! ṅa nti, gi Laisha! Éwù, Anatot nke ewedara n'ala!


Okwu nke Aisaia nwa Emoz huru bayere Juda na Jerusalem.


N'ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere ndi Anatot, bú ndi nāchọ ndu-gi, si, I gaghi-ebu amuma n'aha Jehova, ka i we ghara inwu site n'aka-ayi:


Ma ub͕u a, n'ìhi gini ka i nābasighi Jeremaia onye Anatot nba ike, onye nēme onwe-ya onye-amuma n'ebe unu nọ,


Okwu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, si,


na Jeremaia siri na Jerusalem pua ije ala Benjamin, iketa òkè-ya n'ebe ahu, n'etiti ndi Israel.


okwu Jehova ruru Ezikiel nwa Buzi, bú onye-nchu-àjà, nti n'ezie n'ala ndi Kaldea, n'akuku osimiri Keba; aka Jehova we di ya n'aru n'ebe ahu.


n'arọ mbu nke ọbubu-eze-ya ka mu onwem, bú Daniel, jiri akwukwọ nile ayi ghọta ọnu-ọgugu arọ ahu, nke okwu Jehova ruru Jeremaia, bú onye-amuma, nti bayere ha, imezuru nkpọnkpọ ebe nile nke Jerusalem, bú ọgu arọ atọ na iri.


Okwu Emos, onye nọ n'etiti ndi-nche-anu-ulo nke Tekoa, nke ọ huru bayere Israel n'ubọchi Uzaia, bú eze Juda, na n'ubọchi Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel, arọ abua tutu ala-ọma-jijiji.


Amazaia, bú onye-nchu-àjà Bet-el, we zigara Jeroboam, bú eze Israel, ozi, si, Emos ekekọtawo madu imegide gi n'etiti ulo Israel: ala apughi inagide okwu-ya nile.


Ha we si, Ufọdu si, Jọn Baptist; ma ndi ọzọ si, Elaija: ma ibe-ha si, Jeremaia, ma-ọbu otù nime ndi-amuma.


Mb͕e ahu ka emezuru okwu ekwuru site n'ọnu Jeremaia onye-amuma, si,


Mb͕e ahu okwu ekwuru site n'ọnu Jeremaia onye-amuma mezuru, si, Ha we chiri orú ego ọla-ọcha na iri ahu, bú ọnu-ahia nke Onye aruru ọnu-ahia-Ya, Onye ufọdu site na umu Israel ruru ọnu-ahia-Ya;


Follow us:

Advertisements


Advertisements