Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jenesis 19:2 - Bible Nso

2 si, Biko, le, ndi-nwem, biko, sinu n'ije-unu wezuga onwe-unu bà n'ulo orù-unu, nọ ọnọdu-abali, sa kwa ukwu-unu, unu gēbili n'isi-ututu, la, Ha si, É-è, kama ọ bu n'amá ka ayi gānọ ọnọdu-abali.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ọ sịrị, “Ndị nwe m, batanụ nʼụlọ ohu unu. Unu nwere ike saa ụkwụ unu, nọọkwa ọnọdụ abalị. Chi bọọ, unu nwere ike ibilikwa bido ịga nʼihu nʼije unu.” Ha zara sị, “Ee, anyị ga-edina nʼama.”

See the chapter Copy




Jenesis 19:2
15 Cross References  

biko, ka ekute nwantī miri, unu sa ukwu-unu, zuru-kwa-nu ike n'okpuru osisi a:


Abua nime ndi-mọ-ozi ahu we biarue Sọdọm n'anyasi; ma Lot nānọdu n'ọnu-uzọ-ama Sọdọm: Lot we hu ha anya, bilie izute ha, ọ da kpue iru-ya n'ala,


O rugide ha nke-uku; ha we si n'ije-ha wezuga onwe-ha jekuru ya, ba n'ulo-ya; O we mere ha oké oriri, sie achicha ekoghi-eko, ha rie.


O we si, Bata, gi onye agọziri agọzi nke Jehova; n'ìhi gini ka i nēguzo n'èzí? n'ihi na mu onwem edoziwo ulo, na ebe camel-i gānọ.


Nwoke ahu we me ka ndikom ahu bata n'ulo Josef, ọ nye ha miri, ha we sa ukwu-ha; ọ nye kwa inyinya-ibu nile ha nri-anu-ulo.


Devid we si Uraia, Rida n'ulo-gi, sa ukwu-gi. Uraia we si n'ulo eze pua, onyinye nri eze nyere ya we puso ya n'azu.


Ọ bughi n'èzí ka ọbìa nānọ ọnọdu-abali; Anam emeghe ọnu-uzọm n'ebe uzọ-amá di.


Me ka ukwu-gi kọ ukọ n'ulo madu-ibe-gi; Ka ihe-gi we ghara iju ya afọ, o we kpọ gi asì.


Eyipuwom uwem; #m'gēsi aṅa yiri ya? Asawom ukwum abua; #m'gēsi aṅa me ka ha rue inyi?


Mb͕e O chigharisiri n'ebe nwanyi ahu nọ, Ọ si Saimon, Ì huru nwanyi a? Abataram n'ulo-gi, i nyeghi m miri iji sa ukwu: ma nwanyi a were anya-miri-ya desa ukwum, were kwa agiri-isi-ya hicha ha.


Mb͕e ahu O tinye miri n'ihe anēji sa aru, we malite isa ukwu ndi nēso uzọ-Ya, na iji ákwà anēji hicha aru nke O kereri n'úkwù hicha ukwu-ha.


Mb͕e emere ya na èzí-na-ulo-ya baptism, ọ riọ ayi, si, Ọ buru na unu atulewo na abum onye kwere n'Onye-nwe-ayi, batanu n'ulom, nọgide n'ebe ahu. O we rugide ayi.


Unu echezọla ile ndi-ọbìa nke-ọma: n'ihi na ufọdu esitewo na nka le ndi-mọ-ozi ọbìa nāmaghi ama.


Follow us:

Advertisements


Advertisements