Achiri ya n'ihe-ike, ma ya onwe-ya wedara onwe-ya n'ala, we ghara isaghe ọnu-ya; dika aturu nke anākpuru ije n'ob͕ub͕u-ya, na dika nne-aturu nke dara ob͕i n'iru ndi nākpacha ya aji; e, ọ dighi-asaghe ọnu-ya.
Onye nime ndi-amuma ka nna-unu-hà nēsob͕ughi? ha we b͕ue ndi buru uzọ kwusa okwu bayere ọbibia nke Onye ezi omume ahu; Onye unu onwe-unu ghọrọ ub͕u a ndi rara Ya nye na ndi b͕uru Ya:
Ma ibe ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nke ọ nāgu bu nka, Esekpuru Ya, dika aturu, je ob͕ub͕u; Dika nwa-aturu da-kwa-ra ob͕i n'iru onye nākpacha ya aji, Otú a ka Ọ nādighi-asaghe ọnu-Ya:
Agu nāgu unu, ma unu enwegh: unu nēb͕u madu, nēkwo kwa ekworo, unu apughi kwa ihu ihe unu chọrọ: unu nālu ọ̀gù, nēbu kwa agha; unu enweghi, n'ihi na unu ariọghi.