Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Hosiya 1:2 - Bible Nso

2 Isi-nmalite nke ikwu-okwu Jehova n'ọnu Hosea. Jehova we si Hosea, Je, luru n'onwe-gi nwunye nke nākwa iko na umu amuru n'ikwa-iko: n'ihi na ala nka nākwa iko nke-uku, ghara iso Jehova.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Na mmalite okwu Onyenwe anyị site nʼọnụ Hosiya, Onyenwe anyị gwara Hosiya sị, “Gaa lụtara onwe gị nwanyị na-akwa iko na ụmụ amụtara nʼịkwa iko, nʼihi na dịka nwanyị alụrụ alụ nʼakwa iko, ala a na-akwa iko nke ukwu site nʼịgbahapụ Onyenwe anyị.”

See the chapter Copy




Hosiya 1:2
24 Cross References  

kama i jewo ije n'uzọ ndi-eze Israel, me Juda na ndi bi na Jerusalem ka ha kwa iko, dika ulo Ehab mere ka akwa iko; ọzọ kwa, umu-nne-gi ndikom, bú ulo nna-gi, ndi di nma kari gi onwe-gi, ka i b͕uworo:


Ewe were ọlu nile ha me ka ha buru ihe ruru árú, Ha we nākwa iko n'omume nile ha.


N'ihi na, le, ndi nọ gi n'ebe di anya gāla n'iyì: I kpochapuwo onye ọ bula nke nāpu n'aka-Gi akwa iko.


N'ihi na ihe ọjọ abua ka ndim meworo; Mu ka ha rapuworo, bú isi-iyi nke miri nēnye ndu, ka ha we gwuwara onwe-ha olùlù-miri di iche iche, bú olùlù-miri tipúru etipú, nke nānagideghi miri.


N'ihi na site na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka M'b͕ajiworo yoke-gi, tijie ab͕u-gi nile; i we si, M'gaghi-efè òfùfè; n'ihi na n'elu ugwu ntà ọ bula di elu nan'okpuru osisi ndu ọ bula ka gi onwe-gi nērulata onwe-gi, nākwa iko.


Ì gēsi aṅa si, Arughm árú, ejesoghm Bealim? le uzọ-gi na ndagwurugwu, mara ihe i meworo: i bu nwa-ab͕ọghọ-camel di nkọ nāb͕aghari n'uzọ-ya nile;


O rue, site n'idi-nfe nke ikwa-iko-ya, na emeruru ala-ya, ọ we kwaso nkume, kwaso kwa osisi, iko.


Ndi-unu b͕apuru ab͕apu gēcheta kwa Mu onwem n'etiti mba nile ebe adọtara ha n'agha, mb͕e M'tiwaworo obi-ha nke nākwa iko, nke siworo n'ebe M'nọ wezuga onwe-ya, na anya-ha, nke nākwaso arusi nile ha iko: ha gāsọ kwa onwe-ha oyi n'iru ha n'ihi ihe ọjọ nile nke ha meworo n'ihe-árú nile ha.


Ọ gāb͕aso kwa ndi nāhu ya n'anya, ma ọ gaghi-eru ha aru; ọ gāchọ kwa ha, ma ọ gaghi-achọta ha: o we si, Ka m'je laghachikuru dim mbu; n'ihi na ọ dim nma mb͕e ahu kari ub͕u a.


Jehova we sim, Je kwa, hu nwanyi n'anya nke iko huworo ya n'anya, nke bu kwa nwanyi aluru na nwunye nākwa iko, dika Jehova si ahu umu Israel n'anya, ọ bu ezie na ha onwe-ha nēche iru na chi ọzọ di iche iche, nāhu kwa mbadamba nkpuru-vine amiri ami n'anya.


Mu onwem mara Efraim, Israel ezonarighkwam: n'ihi na ub͕u a i kwawo iko, Efraim, emeruwo Israel.


Nmalite ozi ọma jisus Kraist, Ọkpara Chineke.


Jehova we si Moses, Le, gi na nna-gi-hà ganēdina; ndi nka gēbili kwa, soro chi ala ọzọ nile nke ala ahu kwa iko, bú ebe ha onwe-ha nābà n'etiti ya, ha gārapukwam, mebi kwa ọb͕ub͕a-ndum nke Mu nà ha b͕ara.


ha bu ndi nwere anya nke juputara n'aru nwanyi nākwa iko, anya nke nāpughi kwa ighara imehie; ha bu kwa ndi nārafu nkpuru-obi ndi nādighi-eguzosi ike; ha nwekwara obi anwaputaworo n'anya-uku; buru kwa umu nke ọbubu-ọnu;


edekwasi-kwa-rari aha n'egedege-iru-ya, bú IHE-OMIMI, BABILON UKU AHU, NNE NKE NDI NÁKWA IKO NA NKE IHE-ÁRÚ NILE NKE UWA.


Follow us:

Advertisements


Advertisements