Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Daniel 7:20 - Bible Nso

20 achọ-kwa-ram ima ihe bu ezi-okwu bayere mpi iri ahu nke di n'isi-ya, na mpi ọzọ ahu nke rigotara, nke mpi atọ da-kwa-ra n'ala n'iru ya; ọbuná mpi ahu nke nwere anya di iche iche na ọnu nke nēkwu oké ihe di iche iche, nke di uku kari ibe-ya nile n'ile ya anya.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Asịkwa m ya kọwaara m ihe mpi iri ahụ dị ya nʼisi pụtara, na ihe banyere mpi nke ọzọ puputara, na ihe mere e ji nyakapụ mpi atọ ahụ nʼihi ya. Asị m ya kọwakwara m ihe banyere mpi ahụ, nke nwere anya, na ọnụ na-ekwu okwu jupụtara nʼịnya isi, ma dịkwa ka ọ dị ike karịa ndị ọzọ.

See the chapter Copy




Daniel 7:20
9 Cross References  

Otú a ka ọ siri, Anu nke-anọ gābu ala-eze nke-anọ n'uwa, nke gāpu iche n'ala-eze nile, ọ gēripia kwa uwa nka nile, zọpia ya, tapia ya.


Anọm nēlegide mpi iri ahu, ma, le, otù mpi ọzọ, nke di ntà, rigotara n'etiti ha, ewe ropu mpi atọ nime mpi iri mbu n'iru ya: ma, le, anya di iche iche, dika anya madu, di na mpi a, na otù ọnu nke nēkwu oké ihe di iche iche.


Anọm nāhu na mb͕e ahu n'ihi olu nke oké okwu nile nke mpi nēkwu: anọm nāhu rue mb͕e eb͕uru anu ahu, la aru-ya n'iyì, rara ya nye nsure-ọku.


Ewe hu ihe-iriba-ama ọzọ n'elu-igwe; ma le, oké dragon nke nācha ọku ọku, nke nwere isi asa na mpi iri, nēkpu kwa okpu-eze asa n'isi-ya.


Mb͕e nka gasiri m'nọ nāhu n'ọhù nile nke abali, ma le, otù anu, nke mere ha anọ, nke di egwu, nwe ume, dikarisiri ike; ọ nwe-kwa-ra ezé di uku nke ígwè: o ripiara ihe tapia kwa, ma nke fọduru, o jiri ukwu-ya zọtọ ya: anu ahu di kwa iche n'anu nile buru ya uzọ; o nwe-kwa-ra mpi iri.


Mb͕e ahu ka m'chọrọ ima ihe bu ezi-okwu bayere anu nke-anọ ahu nke puru iche nime ha nile, nke dikarisiri egwu, nke ezé-ya nile bu ígwè, mbọ-ya nile buru ọla; nke ripiara, tapia, were ukwu-ya nile zọtọ nke fọduru;


Anọm nāhu, mpi ahu we nēbuso ndi nsọ agha, nwe ike imegide ha;


Follow us:

Advertisements


Advertisements