Daniel 6:16 - Bible Nso16 Mb͕e ahu eze kwuru, ha we me ka Daniel bia, ha we tubà ya n'olùlù ọdum. Eze zara, si Daniel, Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nēfè mb͕e nile, Ya onwe-ya gādọputa gi. See the chapterBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a16 Nʼikpeazụ, eze nyere iwu, ha kpụpụtara Daniel tụba ya nʼolulu ọdụm. Eze gwara Daniel, “Ka Chineke gị, onye ahụ ị na-efe mgbe niile, zọpụta gị.” See the chapter |
Ndi-isi ala-eze nile, na ndi-isi, na ndi nọchiri anya eze, na ndi-ndum-ọdu, na ndi nāchi achi, ab͕awo ìzù ime ka otù ukpuru eze guzosie ike, na ime ka otù isọ-nsọ di ike, na onye ọ bula nke gāriọ chi ọ bula ma-ọbu madu ọ bula aririọ rue orú ubọchi na iri, ma-ọbughi nání gi, eze, na agātubà ya n'olùlù ọdum.
Ub͕u a asi na unu ejikerewo na mb͕e unu gānu olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke dulcimer, na nke ubọ na opì nile di iche iche, unu gāda n'ala kpọ isi ala nye onyinyo ahu nke m'meworo, ọ di nma: ma asi na unu adighi-akpọ isi ala, n'otù mb͕e ahu ka agātubà unu n'etiti oké ọku nēnwu ajọ onwunwu; ònye bu kwa chi ahu nke gānaputa unu n'akam?