Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Daniel 5:9 - Bible Nso

9 Mb͕e ahu eze, bú Belshaza, mara jijiji nke-uku, ib͕u-maramara nke iru-ya b͕anwe-kwa-ra n'aru ya, ọ nāb͕a kwa ndi-isi-ya ghari.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Nke a mere, ka eze Belshaza maa jijiji karịa, ihu ya gburu maramara ma gbarụkwaa. Ọ gbakwara ndị ozi ya gharịị.

See the chapter Copy




Daniel 5:9
12 Cross References  

O we b͕a àkú-Ya, me ka ha b͕asa; Ọtutu àmùmà kwa, O we chusa ha.


Ọma-jijiji jidere ha n'ebe ahu; Ihe-nb͕u, dika nke nwayi nāmuputa nwa.


Biko, juanu, hu ma ime nēme nwoke: gini mere M'huworo ndikom nile n'otù ka aka-ha di n'úkwù-ha, dika nwanyi ime nēme, iru nile ab͕anwewo kwa we di ka nke ozu?


Ayi anuwo ùdé-ya; aka-ayi akudawo: ihe-nb͕u ejidewo ayi, ihe-nb͕ali dika nke nwayi ime nēme.


Mu onwem we fọduru náním, m'we hu ọhù uku a, ike we ghara ifọdu nimem: n'ihi na ebubem b͕anwere ghọ ihe-nbibi n'arum, m'we ghara inagide ike ọ bula.


Ma n'arọ nke-abua nke ọbubu-eze nke Nebukadneza, Nebukadneza rọrọ nrọ di iche iche; mọ-ya we basasia, ura-ya we gwu n'anya-ya.


Mb͕e ahu ib͕u-maramara nke iru eze b͕anwere, èchìchè-ya nile nēme kwa ka ọ ma jijij; nkwonkwo úkwù-ya nātọpusi kwa, ikperè-ya abua nākukọrita kwa onwe-ha.


Ma mb͕e Herod, bú eze, nuru, obi lọrọ ya miri, ya na Jerusalem nile.


Ndi-eze nke uwa, na ndi-amadi, na ndi-isi-ọchi-agha, na ndi-ọgaranya, na ndi di ike, na orù ọ bula, na onye ọ bula nwere onwe-ya, we zobe onwe-ha nime ọb͕à na nime oké nkume nke ugwu:


Follow us:

Advertisements


Advertisements