Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Daniel 3:18 - Bible Nso

18 Ma asi na Ọ pughi inaputa ayi, ka i mara, eze, na chi-gi nile ka ayi nāgaghi-adi nēfè, ọ bu kwa onyinyo ọla-edo ahu nke i guzobeworo ọtọ ka ayi nāgaghi-akpọ isi ala nye.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ma ọ bụrụkwa na ọ zọpụtaghị anyị, mata nke ọma, o eze, na anyị agaghị efe chi gị ndị a maọbụ kpọọ isiala nye oyiyi a ị kpụrụ akpụ nke ị guzobere.”

See the chapter Copy




Daniel 3:18
20 Cross References  

Ọ si, Ekwoworom Jehova, bú Chineke usu-ndi-agha, ekworo nke-uku; n'ihi na umu Israel arapuwo ọb͕ub͕a-ndu-Gi, tipia ebe-ichu-àjà-Gi nile, were mma-agha b͕ue ndi-amuma-Gi; ọ fọduru mu onwem, náním; ha nāchọ kwa ndum, iwepu ya.


Ma M'gēme ka nnù madu iri-na-asa na ọgu iri fọdu n'Israel, bú ikperè nile nke anēb͕ughi nye Beal, na ọnu ọ bula nke nēsutughi ya.


Le, Ọ gēb͕um; m'gaghi-echere: Otú ọ di, uzọm nile ka m'gāru uka n'iru Ya.


Ndi nēmebi iwu ab͕alagawo mb͕e ọ dighi onye nāchu ha: Ma ndi ezi omume nwere ntukwasi-obi dika ọdum.


Nebukadneza zara, si, Onye agọziri agọzi ka Chineke nke Shedrak na Mishak na Abed-nego bu, Onye ziteworo mọ-ozi-Ya, we naputa ndi-orù-Ya ndi tukwasiri Ya obi, ọ bu kwa okwu eze ka ha b͕anweworo, we rara aru-ha nye, ka ha we ghara ifè ma-ọbu ikpọ isi ala nye chi ọ bula, ma-ọbughi Chineke-ha.


Unu echela ihe-efu ọ bula iru, unu eme-kwa-lara onwe-unu chi ọ bula awuru awu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


Unu atu-kwa-la egwu ndi nēb͕u aru, ma ha apughi ib͕u nkpuru-obi: kama nātunu egwu Onye ahu Nke puru ila nkpuru-obi na aru n'iyì n'ọku ala-mọ.


Onye chọtara ndu-ya gētufu ya; onye tufu-kwa-ra ndu-ya n'ihim gāchọta ya.


Ma Ọ zara, si ha, Mb͕e o ruru anyasi, unu nāsi, Iru elu-igwe gādi nma: n'ihi na elu-igwe nācha uhie uhie.


Ma Pita na Jọn zara, si ha, Kpenu ma ọ bu ihe ziri ezi n'anya Chineke inu olu-unu kari olu Chineke:


n'ihi na ọ chọrọ ka emejọkọ ya na ndi nke Chineke, kama inwe ihe-utọ nke nmehie na nwa oge;


Ma ọ buru na ọ jọ njọ n'anya-unu ifè Jehova òfùfè, rọputaranu onwe-unu ta onye unu gēfè òfùfè; ma ọ bu chi nile nke nna-unu-hà fère òfùfè nke di n'ofè Osimiri ahu, ma-ọbu chi nile nke ndi-Amorait, ndi unu onwe-unu bi n'ala-ha: ma mu onwem na ulom, ayi gēfè Jehova òfùfè.


Ndi ahu we merie ya n'ihi ọbara Nwa-aturu ahu, na n'ihi okwu àmà-ha; ha ahughi kwa ndu-ha n'anya rue ọnwu.


Follow us:

Advertisements


Advertisements