Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Aịzaya 61:11 - Bible Nso

11 N'ihi na dika ala si eme ka ihe-opupú-ya puta, na dika ubi ab͕ara ogige si eme ka ihe aghaworo nime ya pue; otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova gēme ka ezi omume na otuto pute n'iru mba nile.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Dịka aja dị nʼubi si eme ka ihe a kụrụ nʼubi pupụta, dịka ubi a gbara ogige si eme ka mkpụrụ ubi too, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-esi mee ka ezi omume na otuto pupụta nʼihu mba niile.

See the chapter Copy




Aịzaya 61:11
24 Cross References  

Chineke we si, Ka ala puputa ahihia ndu, ihe-ọkukú nke nāmiputa nkpuru-ọghigha, osisi mkpuru nke nāmi mkpuru di iche iche, nke mkpuru-ọghi-gha-ya di nime ya, n'elu ala: o we di otú a.


Ka ọtutu ọka di n'ala n'elu ugwu nile; Nkpuru-ya ganēme nkpatu dika Lebanon: Madu gēsi kwa n'obodo wa okoko-osisi dika ihe akuru n'ala.


Ugwu nile gēbutere ndi-Gi udo, Ugwu ntà kwa, n'ezi omume.


Ezi-okwu nēpú epú n'ala; Ezi omume esiwo kwa n'elu-igwe lepu anya.


Teta, gi ifufe Ugwu; bia kwa, gi ifufe Ndida; Fekwasi ubim ab͕ara ogige, ka uda-ya di iche iche we rùpu. Ka onye ihe-ya nātọm utọ bata n'ubi-ya ab͕ara ogige, We rie nkpuru-ya di iche iche nke di oké ọnu-ahia.


N'ubọchi ahu ka ihe-opupú nke Jehova gāghọ ihe mara nma na ihe-nsọpuru, nkpuru nke ala gāghọ-kwa-ra ndi Israel b͕apuru ab͕apu nbili-elu na ima-nma.


Ejiwom Onwem ṅua iyi, otù okwu esiwo n'ọnum puta n'ezi omume, ọ gaghi-alaghachi kwa, si, na Mu onwem ka ikperè nile ọ bula gēb͕uru, Mu ka ire nile ọ bula gāṅuru iyi.


Nání na Jehova ka ezi omume nile na ike di, (mu ka agwara okwu a): Ya ka madu gābiakute, ihere gēme kwa ndi ahu nile iwe-ha di ọku megide Ya.


Unu elu-igwe, nātasinu ezi omume site n'elu, ka mbara-ígwé nile nēzoda kwa ezi omume dika miri: ka ala meghe onwe-ya, ka ha we mia nzọputa dika nkpuru, ka o me kwa ezi omume ka ọ pukọ n'otù; Mu onwem, bú Jehova, ekèwo ya.


Ewetawom ezi omumem nso, ọ gaghi-adi n'ebe di anya, nzọputam agaghi-anọ kwa ọdù; M'we nye nzọputa nime Zaion, nye kwa Israel ima-nmam.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na i ṅarari nti n'ihe nile M'nyere n'iwu! udo-gi ewe diwori ka osimiri, ezi omume-gi adi kwa ka nmali-miri nile nke oké osimiri:


Jehova ganēdu kwa gi mb͕e nile, me ka afọ ju nkpuru-obi-gi n'ebe nile nkpọrọ nku, Ọ gēme kwa ka ọkpukpu-gi nile di ike; i gādi kwa ha ubi ab͕ara ogige nke dere miri nke-ọma, di kwa ka ebe miri nāsuputa nke miri-ya nādighi-ata ata.


Agaghi-anu kwa ihe-ike ọzọ n'ala-gi, agaghi-anu nbibi na ntipia n'ókè-ala-gi nile; ma i gākpọ mb͕idi-gi nile Nzọputa, kpọ kwa ọnu-uzọ-ama-gi nile Otuto.


Ndi-gi kwa, ha nile gābu ndi ezi omume, rue mb͕e ebighi-ebi ka ha gēnweta ala; alaka nke ọkukúm, ọlu akam, ime ka M'ma nma.


N'ihi Zaion m'gaghi-edebe ọnum du, na n'ihi Jerusalem m'gaghi-anọ jū, rue mb͕e ezi omume-ya gāputa ihè dika onwu-maramara, nzọputa-ya kwa dika ọwa nke nēnwu enwu.


Mba di iche iche gāhu kwa ezi omume-gi, eze nile gāhu nsọpuru-gi: agākpọ kwa gi aha ọhu nke ọnu Jehova gāgu.


unu ekwe-kwa-la ka O dere du, rue mb͕e Ọ gēme ka Jerusalem guzosie ike, ru kwa mb͕e Ọ gēme ya ka ọ buru otuto n'uwa.


Onye agha-kwa-ra n'ala ahu di nma, madu a bu onye nānu okwu ahu, we ghọta ya; onye nāmi nkpuru n'ezie, miputa, otù ọgu ise, ọzọ ọgu atọ, ọzọ orú na iri.


O we gwa ha ọtutu okwu n'ilu di iche iche, si, Le, ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru;


Nkpuru ọzọ we da n'ala di nma, ha we nāmi nkpuru, otù ọgu ise, ọzọ ọgu atọ, ọzọ orú na iri.


Ma unu onwe-unu bu ọb͕ọ ndi arọputaworo, òtù ndi-nchu-àjà ndi bu kwa eze, mba di nsọ, ndi nke Chineke nwetara, ka unu we kwusa idi-nma nile nke Onye ahu Onye kpọputara unu n'ọchichiri ahu ba n'ìhè-Ya di ebube:


Follow us:

Advertisements


Advertisements