Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Aịzaya 60:7 - Bible Nso

7 Ìgwè ewu na aturu nile nke Kida ka agāchikọtara gi, ebulu nile nke Nebaiot gējere gi ozi: ha gārigota n'ebe-ichu-àjàm dika ihe nātọ utọ, M'gēme kwa ulo nke ima-nmam ka ọ ma nma.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 A ga-enye gị igwe ewu na atụrụ niile nke ndị Keda. Ebule niile nke Nebaiot ga-abụ nke gị. A ga-anabata ha dịka onyinye nʼelu ebe ịchụ aja m. Aga m edozi ụlọnsọ m dị ebube, mee ya ka ọ maa mma karịa.

See the chapter Copy




Aịzaya 60:7
20 Cross References  

M'gēme ka ha biarue ugwu nsọm, M'gēme kwa ka ha ṅuria n'ulo-ekperem; àjà-nsure-ọku nile ha na àjà nile ha gābu ihe nātọ utọ n'elu ebe-ichu-àjàm: n'ihi na agākpọ ulom ulo ekpere diri ndi nile di iche iche.


ndia bu kwa aha umu-ndikom Ishmael, n'aha-ha, dika osuso-ọmumu-ha si di: ọkpara Ishmael, Nebaiot; na Kida, na Adbeel, na Mibsam,


ka m'we buru onye nēfè Kraist Jisus òfùfè ijekuru ndi mba ọzọ, nālu kwa ọlu onye-nchu-àjà nke ozi ọma Chineke, ka ewe me ka iche-ndi-mba-ọzọ-n'iru-Chineke buru ihe agānara nke-ọma, ebe edoro ya nsọ nime Mọ Nsọ.


Ma ub͕u a, chirinu n'onwe-unu oke-ehi asa na ebulu asa, jekuru orùm, bú Job, surere onwe-unu àjà-nsure-ọku; Job, bú orùm, gēkpe kwa ekpere bayere unu; n'ihi na n'ezie ọ bu ya ka M'gāhu iru-ọma, ka M'ghara imeso unu dika nzuzu-unu si di; n'ihi na unu ekwughi ihe ziri ezi bayerem, dika orùm, bú Job, kwuru.


Ya mere, umu-nnam, ejim obi-ebere nile nke Chineke nāriọ unu, ka unu che aru-unu n'iru Chineke, dika àjà di ndu, di nsọ, nke di Chineke ezi utọ, nke bu ikpe-ekpere-unu dika uche si di.


Ka ọzara na obodo-ya nile welie olu-ha, obodo ntà nile Kida bi: ka ndi bi na Sela tie nkpu ọṅù, ka ha si n'elu ugwu nile tisie nkpu ike.


Ayi nwere ebe-ichu-àjà, nke ndi nēkpe ekpere n'ulo-ikwū Chineke nēnweghi ike iri ihe si nime ya puta.


Ebube Lebanon gābiakute gi, osisi fir na osisi pine na osisi cypress n'otù; ime ka ọnọdu ebe nsọm ma nma, M'gēme kwa ka ọnọdu ukwum abua nwe nsọpuru.


Ahuhu dirim, na anọm dika ọbìa nime Meshek, Na ebim n'akuku ulo-ikwū nile nke Kida!


Onye oji ka m'bu, ma amaram nma, Unu umu-ndinyom Jerusalem, Dika ulo-ikwū nile nke Kida, Dika ákwà-nkwuba nile nke Solomon.


N'ubọchi ahu ebe-ichu-àjà gādiri Jehova n'etiti ala Ijipt, otù ogidi n'akuku ókè-ala-ya gādi-kwa-ra Jehova.


Jehova gēme kwa ka Ijipt mara Ya, ndi Ijipt ewe mara Jehova n'ubọchi ahu; ha gēji kwa àjà na onyinye-inata-iru-ọma fè Ya, ha gēkwe kwa Jehova nkwa, kwughachi kwa ya.


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi siworom, Tutu otù arọ agwu, dika arọ onye egoro ọlu si di, nsọpuru nile nke Kida gāgwusi:


N'ihi na n'ugwu nsọm, n'ugwu nke ebe di elu nke Israel, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ebe ahu ka ulo Israel nile, ka ọ ra, gēfèm n'ala-ha: n'ebe ahu ka ihe-ha gātọm utọ, ọ bu kwa n'ebe ahu ka M'gāchọ àjà-nbuli nile unu na nkpuru mbu nke ùtú nile unu, ha na ihe nsọ nile unu.


Arebia na ndi-isi nile nke Kida, ndi ahu bu ndi-ahia nke aka-gi; n'umu-aturu na ebulu na ewu, n'ihe ndia ka ha bu ndi-ahia-gi.


Site n'ofè osimiri nile nke Etiopia ka ndi-aririọm, bú ada ndim achusara achusa, gēburu onyinye-inata-iru-ọmam.


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ bu mb͕e nsọpuru gasiri ka O ziworom jekuru mba nile ndi nākwata unu: n'ihi na onye nēmetu unu aka nēmetu nwa-anya-Ya.


Ọ gēru kwa, n'ikpe-azu nke ubọchi ndia, na ugwu nke ulo Jehova ganēguzosi ike n'elu ugwu nile, agēbuli kwa ugwu ahu elu kari ugwu ntà nile; ndi di iche iche gērùbà nime ya dika osimiri.


Follow us:

Advertisements


Advertisements