Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Aịzaya 51:11 - Bible Nso

11 Ndi Jehova ab͕aputara ab͕aputa gālata kwa, were iti-nkpu-ọṅù bata nime Zaion; ọṅù ebighi-ebi gādi kwa n'isi-ha: obi-utọ na ọṅù ka ha gābiarute, iru-újú na ize-ume ab͕alawo.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa. Ha ga-eji abụ bata na Zayọn; ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha, oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha, iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga.

See the chapter Copy




Aịzaya 51:11
29 Cross References  

Mb͕e ahu ọchì nēju ayi ọnu, Iti-nkpu-ọṅù nēju kwa ayi ire: Mb͕e ahu ha nāsi n'etiti mba nile, Jehova emeworo ndia ihe uku.


Ndi ji anya-miri agha nkpuru gēji iti-nkpu-ọṅù we ihe-ubi.


Jehova gēwezuga ire oké osimiri nke Ijipt ka ebibie ya; Ọ gēji kwa okpom-ọku nke ifufe-Ya feghari aka-Ya n'elu Osimiri, tiputa ya iyi asa, me ka madu zọ ya ukwu n'akpukpọ-ukwu.


O lodawo ọnwu rue mb͕e ebighi-ebi; Onye-nwe-ayi Jehova gēhichapu kwa anya-miri n'iru nile; ita-uta nke ndi-Ya ka Ọ gēwezuga kwa n'elu uwa nile: n'ihi na Jehova ekwuwo ya.


ndi Jehova ab͕aputara ab͕aputa gālata kwa, were iti-nkpu-ọṅù bata nime Zaion; ọṅù ebighi-ebi gādi kwa n'isi-ha: obi-utọ na ọṅù ka ha gābiarute, iru-újú na ize-ume ewe b͕alaga.


Tienu nkpu ọṅù, unu elu-igwe, n'ihi na Jehova emewo ya; tienu nkpu, unu ebe nile di ala nke uwa; unu ugwu, tibenu nkpu ọṅù, gi oké ọhia, na osisi ọ bula di nime ya: n'ihi na Jehova ab͕aputawo Jekob, ọ bu kwa n'Israel ka Ọ gēme Onwe-ya ka Ọ ma nma.


Sinu na Babilon pua, b͕anarinu ndi Kaldea; werenu olu nke iti-nkpu-ọṅù gosi, me ka anuru nka, menu ka ọ puta ìhè rue nsọtu uwa: sinu, Jehova ab͕aputawo orù-Ya, bú Jekob.


Tienu nkpu ọṅù, unu elu-igwe; tegharia egwú ọṅù, gi uwa; tiwanu nkpu ọṅù, unu ugwu: n'ihi na Jehova akasiwo ndi-Ya obi, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru ndi-Ya ewedara n'ala.


N'ihi na ọṅù ka unu gēji puta, udo ka agēji kwa duru unu: ugwu nile na ugwu ntà nile gētiwa nkpu ọṅù, n'iru unu, osisi nile nke ọhia gāku kwa aka-ha.


N'ọnọdu ihere-unu unu gēnwe okpukpu: n'ọnọdu-ihere ha gēti nkpu ọṅù n'òkè-ha: n'ihi ya n'ala-ha okpukpu ka ha gēnweta: ọṅù ebighi-ebi gādiri ha.


le, ndi-orùm gēti nkpu ọṅù site n'obi di nma, ma unu onwe-unu gēti nkpu site n'ihe-nb͕u nke obi, unu gēsite kwa na ntiwa nke mọ-unu kwasi ákwá ike.


M'gēteghari kwa egwú ọṅù n'aru Jerusalem, obi gātọkwam utọ n'aru ndim: agaghi-anu kwa olu ikwa-ákwá nime ya ọzọ, ma-ọbu olu iti-nkpu.


Mb͕e ahu ka nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke gāṅuri ọṅu n'otite-egwú, umu-okorọbia na ndi-okenye gāṅuri kwa ọṅu n'otù: n'ihi na M'gāb͕anwe oruru-újú-ha n'obi-utọ, kasi kwa ha obi, me ka ha si na nwuta-ha ṅuria ọṅu.


agānu kwa ọzọ olu nke obi-utọ na olu ọṅù, na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu, na olu nke ndi nāsi, Kelenu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'ihi na Jehova di nma, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na olu nke ndi nēwebata ekele n'ulo Jehova. N'ihi na M'gēme ka ndi ala nka adọtara n'agha lata dika na mbu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ma ka Ya onwe-ya, bú Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na Chineke, bú Nna-ayi, Onye huru ayi n'anya nye kwa ayi nkasi-obi ebighi-ebi na ezi olile-anya nime amara,


Ma Onye ahu nke puru iche unu nche ka unu ghara isu ngọngọ, na iguzo unu n'iru ebube-Ya nādighi ita uta n'oké obi-utọ,


M'we hu elu-igwe ọhu na uwa ọhu: n'ihi na elu-igwe mbu ahu na uwa mbu ahu gabigarari; oké osimiri adighi kwa ọzọ.


Ọ gēhichapu kwa anya-miri nile ọ bula n'anya-ha; ọnwu agaghi-adi kwa ọzọ; iru-újú ma-ọbu ikwa-ákwá ma-ọbu aru-ufu agaghi-adi kwa ọzọ: ihe ngbu nile agabigawo.


Ọbubu-ọnu ọ bula agaghi-adi ọzọ: oche-eze Chineke na nke Nwa-aturu ahu gādi kwa nime ya: ndi-orù-Ya gēfè kwa Ya òfùfè:


n'ihi na Nwa-aturu ahu Nke nọ n'etiti oche-eze ahu gāzù ha dika aturu, Ọ gēduru kwa ha ga n'isi-iyi nke miri nke ndu: Chineke gēhichapu kwa anya-miri nile ọ bula n'anya-ha.


Follow us:

Advertisements


Advertisements