Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Aịzaya 42:1 - Bible Nso

1 Le orùm, onye M'nējide aka; onye nkem M'rọputara, onye ihe-ya tọrọ nkpuru-obim utọ: atukwasiwom ya Mọm; ikpé ka ọ gēweputara mba nile.o

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 “Lee ohu m, onye m na-agba ume, onye m họpụtara, onye ihe ya na-atọ mkpụrụobi m ụtọ. Aga m eme ka Mmụọ m dịrị nʼime ya. Ọ ga-emekwa ka ikpe ziri ezi rute mba niile aka.

See the chapter Copy




Aịzaya 42:1
47 Cross References  

Nkpa-n'aka eze agaghi-esi n'ebe Juda nọ wezuga onwe-ya, Nkpa-n'aka onye nēnye ukpuru agaghi-esi kwa n'etiti ukwu-ya abua wezuga onwe-ya, Rue mb͕e Shailo gābia; Ọ bu kwa ya gēnwe iṅa-nti ndi di iche iche.


Ọ gēkpe ndi ewedara n'ala n'etiti ndi-Gi ikpe, Ọ gēnye umu nke ob͕eye nzọputa, Zọpia kwa onye-nmeb͕u.


Rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gēme ka nkpuru-gi guzosie ike, M'gēwu kwa oche-eze-Gi rue ọb͕ọ nile. Selah


Ọ gēkpe kwa ikpe n'etiti mba nile, dozi-kwa-ra ọtutu ndi di iche iche okwu-ha: ha gākpughari kwa mma-agha-ha nile ka ha buru mma-ọgè, na ube-ha nile ka ha buru mma-ikwa-osisi: mba agaghi-ebuli mma-agha megide mba, ha agaghi-amuta kwa agha ọzọ.


Mb͕e ahu ikpé ziri ezi gēnwe ebe-obibi-ya n'ọzara, ezi omume gēbi kwa n'ubi ọma ahu.


Ma gi onwe-gi, Israel, orùm, Jekob onye M'rọputara, nkpuru Abraham, bú onye nāhum n'anya;


gi onye M'jidesiworo ike site na nsọtu nile nke uwa, ọ bu kwa n'akuku-ya nile ka M'kpọputara gi, we si gi, Orùm ka i bu, arọputawom i, ajughm i aju:


Ọ gaghi-eti nkpu, ọ gaghi-eweli kwa olu-ya elu, Ọ gaghi-eme kwa ka anu olu-ya n'èzí.


Unu onwe-unu bu ndi-àmàm, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, na orùm nke M'rọputara: ka unu we mara, kwerem, ghọta na Mu onwem bu Onye ahu: ọ dighi chi ọzọ eburu Mu onwem uzọ kpu, ma ọ bu nke gēsom n'azu.


Onye n'etiti unu bu onye nātu egwu Jehova, nēge nti n'olu orù-Ya? onye nke jeworo ije n'ọchichiri, nke ọ dighi onwunwu-ọku o nwere, ya tukwasi obi n'aha Jehova, dabere Chineke-ya.


Le, orùm gēnwe uche, ọ gādi elu, agēbuli kwa ya, o we di elu nke-uku.


Ihe nke sitere na ndọb͕u nkpuru-obi-ya nādọb͕u onwe-ya n'ọlu ka ọ gāhu, afọ gēju ya: ihe-ọmuma-ya ka onye ezi omume ahu, bú orùm, gēji me ka ọrà madu ghọ ndi ezi omume: ajọ omume nile ha ka ya onwe-ya gēbu kwa.


Ma Mu onwem, nka bu ọb͕ub͕a-ndum nke di n'etiti Mu na ha, ka Jehova siri: Mọm nke di n'aru gi, na okwum nile nke M'tiyeworo n'ọnu-gi, agaghi-apu n'ọnu-gi, na n'ọnu nkpuru-gi, na n'ọnu nkpuru nke nkpuru-gi, ka Jehova siri, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.


Mọ nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova, di n'arum; n'ihi na Jehova etewom manu izì ndi ewedara n'ala ozi ọma; O zitewom ikechi ọnyá ndi obi-ha tiwara etiwa, ikpọsa ọrira gwa ndi adọtara n'agha, na ikpọsa nmeghepu ulo-nkpọrọ gwa ndi ekere ab͕u;


Ònye bu nka nēsi n'Edom bia, yiri uwe nācha ọbara-ọbara site na Bọzra? Ònye a nke mara nma n'uwe-oyiyi-Ya, nāzọ ije n'iba-uba nke ike-Ya? Ọ bu Mu onwem nke nēkwu okwu n'ezi omume, di ike izọputa.


N'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ka M'gēwere gi, Zerubabel nwa Shealtiel, bú orùm, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me gi ka i di ka nb͕a-aka-akàrà: n'ihi na gi ka M'rọputaworo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.


Biko, nuru, gi Joshua, bú onye-isi-nchu-àjà, gi onwe-gi na ndi-ibe-gi ndi nānọdu ala n'iru gi; n'ihi na ndi bu ihe-ebube ka ha bu: n'ihi na, le, M'gaje ime ka orùm, bú Ihe-opupú ahu, puta ìhè.


N'ihi na site n'ọwuwa anyanwu we rue ọdida-ya aham di uku n'etiti mba nile; ọ bu kwa n'ebe nile ọ bula ka anēweta nso aham ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ na onyinye-inata-iru-ọma di ọcha: n'ihi na aham di uku n'etiti mba nile, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Mb͕e ọ kpu okwu n'ọnu, le, igwe-oji nke nēnwu enwu kpuchiri ha: le kwa, olu si n'igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma; nurunu okwu-Ya.


Mọ Nsọ we fedakwasi Ya n'oyiyi aru, dika nduru, olu we site n'elu-igwe, si, Gi onwe-gi bu Ọkparam M'huru n'anya; ihe-Gi dim ezi mma.


Mọ nke Onye-nwe-ayi di n'arum. N'ihi na O terem manu izì ndi-ob͕enye ozi ọma: O ziteworom ikwusa ọrira gwa ndi adọtara n'agha, Na ikwusa ihu-uzọ gwa ndi-ìsi, Izipu ndi etihiawara aru ka ha la,


Ikwusa arọ mb͕e Onye-nwe-ayi nānara madu nke-ọma.


Olu we si n'igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam, Onye M'rọputara: nurunu okwu-Ya.


Le, oge hour nābia, ọ biawo kwa, ka unu gāb͕asa, onye ọ bula ọ la na nke ya, unu gārapu kwa nání Mu: otú ọ di, nání Mu anọghi, n'ihi na Mu na Nnam nọ.


N'ihi na Onye ahu Chineke zitere nēkwu okwu Chineke: n'ihi na O siteghi n'ọtùtù enye Mọ Nsọ.


Unu alula ọlu inata ihe-oriri nke nāla n'iyì, kama inata ihe-oriri nke nānọgide rue ndu ebighi-ebi, nke Nwa nke madu gēnye unu: n'ihi na Onye ahu ka Nna, bú Chineke, kara akàrà.


bú Jisus Nke si na Nazaret puta, otú Chineke were Mọ Nsọ na ike te Ya dika manu-otite: Onye jeghariri nālu ọlu ọma, nēme kwa ka aru di ha ike, bú ndi nile ekwensu mere ha dika onye-nwe-ha; n'ihi na Chineke soro Ya.


Ma mb͕e ha nuru ihe ndia, ha kpuchiri ọnu-ha, we nye Chineke otuto, si, Ya mere ọ bu kwa ndi mba ọzọ ka Chineke nyere nchèghari nke nēdubà na ndu.


Ya mere maranu, na nzọputa nka, bú nke Chineke, ka ezigara ndi mba ọzọ: ndi ahu gānu kwa.


Ma Onye-nwe-ayi siri ya, Ga: n'ihi na onye ahu bu ihe-ọlu arọputara nyem, ka o buru aham che n'iru mba ọzọ na ndi-eze, na umu Israel:


dika Ọ roputara ayi nime Ya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa, ka ayi we di nsọ buru kwa ndi anāpughi ita uta n'iru Ya n'ihu-n'anya:


ka ewe to ebube nke amara-Ya, bú nke O were amara me ka ayi nara n'aka-Ya nime Onye ahu Ọ huru n'anya:


Ọ bu mu onwem, bú onye di ntà kari onye dikarisiri ntà n'etiti ndi nsọ nile, ka enyere amara nka, izisara ndi mba ọzọ ozi ọma nke àkù nke Kraist nke anēnweghi ike ituputa ya;


kama O mere Onwe-ya ihe-efu, n'inara udi nke orù, ewe me Ya n'oyiyi nke madu;


Onye dọputara ayi n'ike nke ọchichiri, we webiga ayi n'ala-eze nke Ọkpara nke ihu-n'anya-Ya;


Onye unu nābiakute, bú nkume di ndu, Nke madu juru n'ezie, ma n'ebe Chineke nọ Ọ bu ihe arọputara, buru kwa ihe anāsọpuru,


N'ihi na ekwuru n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, si, Le, anamatọb͕ọ na Zaion otù isi nkume nime nkuku ntọ-ala, nke bu ihe arọputara, buru kwa ihe anāsọpuru: Onye kwe-kwa-ra na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya ma-ọli.


Follow us:

Advertisements


Advertisements