Aịzaya 41:19 - Bible Nso19 M'gāku n'ọzara osisi cedar na osisi acacia na osisi myrtle na osisi manu; M'gāmakọta n'ala ihe nādighi osisi fir na osisi pine na osisi cypress: See the chapterBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a19 Aga m akụ nʼọzara, osisi sida, na osisi akashia, na osisi mietul, na osisi oliv. M ga-eji osisi junipa, na osisi saipres na osisi fịa, kụkọta ha ọnụ nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu, See the chapter |
Ọ bu kwa n'osimiri ahu, n'usọ-ya, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, ka osisi ọ bula nke nāmi nkpuru oriri gēto, akwukwọ-ya agaghi-akpọnwu, nkpuru-ya agaghi-agwu kwa: kwa-ọnwa ka ọ gēme nkpuru mbu, n'ihi na miri-ya, n'ebe nsọ Chineke ka ha si aputa: nkpuru-ya ewe buru ihe-oriri; akwukwọ-ya gābu kwa ihe igwọ agwọ.