Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Aịzaya 41:19 - Bible Nso

19 M'gāku n'ọzara osisi cedar na osisi acacia na osisi myrtle na osisi manu; M'gāmakọta n'ala ihe nādighi osisi fir na osisi pine na osisi cypress:

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Aga m akụ nʼọzara, osisi sida, na osisi akashia, na osisi mietul, na osisi oliv. M ga-eji osisi junipa, na osisi saipres na osisi fịa, kụkọta ha ọnụ nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu,

See the chapter Copy




Aịzaya 41:19
16 Cross References  

N'ọdi-n'iru Jekob gāb͕a nkpọrọgwu: Israel gāb͕awa okoko dika osisi, ma ifuru: ha we mejue iru elu-uwa dum madu bi n'ihe-omume.


rue mb͕e agāwukwasi ayi Mọ site n'elu, ọzara ewe ghọ ubi ọma, agu kwa ubi ọma n'oké ọhia.


Obi gātọ ọzara na ala kpọrọ nku utọ; ala ihe nādighi gēteghari kwa egwú ọṅù, b͕awa okoko-ọhia, dika rose.


Le, anameme ihe ọhu; ub͕u a ka ọ gēpú; ùnu agaghi-ama ya? e, M'gēme ka uzọ di n'ọzara, me kwa ka osimiri di iche iche di n'ala tọb͕ọrọ n'efu.


N'ihi na Jehova akasiwo Zaion obi: Ọ kasiwo nkpọnkpọ ebe-ya nile, me ka ọzara-ya di ka Iden, me ka ala-ya nke ihe nādighi di ka ubi Jehova ab͕ara ogige; obi-utọ na ọṅù ka agāhu nime ya, na ekele, na olu abù ọma.


Nọnọdu ogwu osisi fir gētolite, ọ bu kwa n'ọnọdu nke ka osisi myrtle gētolite: o we ghọrọ Jehova aha, ghọ-kwa-ra Ya ihe-iriba-ama ebighi-ebi nke anāgaghi-ebipu ya.


Ebube Lebanon gābiakute gi, osisi fir na osisi pine na osisi cypress n'otù; ime ka ọnọdu ebe nsọm ma nma, M'gēme kwa ka ọnọdu ukwum abua nwe nsọpuru.


Ndi-gi kwa, ha nile gābu ndi ezi omume, rue mb͕e ebighi-ebi ka ha gēnweta ala; alaka nke ọkukúm, ọlu akam, ime ka M'ma nma.


N'ihi na dika ala si eme ka ihe-opupú-ya puta, na dika ubi ab͕ara ogige si eme ka ihe aghaworo nime ya pue; otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova gēme ka ezi omume na otuto pute n'iru mba nile.


idoro ndi Zaion nēru újú, inye ha ihe ọma ike n'isi n'ọnọdu ntu, manu obi-utọ n'ọnọdu iru-újú, ákwà-nb͕okwasi otuto n'ọnọdu mọ nke inyoghi-inyoghi; ka enwe kpọ ha osisi oak nke ezi omume, ihe-ọkukú nke Jehova, ime ka ọ ma nma.


Ọ bu kwa n'osimiri ahu, n'usọ-ya, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, ka osisi ọ bula nke nāmi nkpuru oriri gēto, akwukwọ-ya agaghi-akpọnwu, nkpuru-ya agaghi-agwu kwa: kwa-ọnwa ka ọ gēme nkpuru mbu, n'ihi na miri-ya, n'ebe nsọ Chineke ka ha si aputa: nkpuru-ya ewe buru ihe-oriri; akwukwọ-ya gābu kwa ihe igwọ agwọ.


Efraim gāsi, Gini ka mu na arusi di iche iche nwekọrọ ọzọ? Mu onwem azawo, M'gēlegide kwa ya anya: mu onwem di ka osisi di ndu; esi nam chọta nkpuru-gi.


Ahurum n'abali, ma, le otù onye nke nānọkwasi inyinya nācha uhie uhie, onye ahu nēguzo kwa n'etiti osisi myrtle nke di n'ebe miri emi; n'azu ya ka inyinya di iche iche guzoro, nke nācha uhie uhie, na nke nācha dika manu, na nke nācha ọcha.


Follow us:

Advertisements


Advertisements