Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Aịzaya 32:5 - Bible Nso

5 Agaghi-akpọ kwa onye-nzuzu onye amara aha-ya ọzọ, agaghi-asi kwa na onye-aghughọ bu ọgaranya.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Nʼụbọchị ahụ, a gaghị ahụkwa onye nzuzu sị na ọ bụ onye maara ihe. A gaghị enyekwa onye aghụghọ nsọpụrụ ọzọ.

See the chapter Copy




Aịzaya 32:5
8 Cross References  

Ndi nēmebi iwu nējeghari buruburu, Mb͕e anēbuli ihe jọb͕uru onwe-ya elu n'ebe umu madu nọ.


Eledawo onye ajuru aju anya n'anya-ya, Ma ndi nātu egwu Jehova ka ọ nā-asọputu. Ọ ṅuwo iyi nke gēmejọ ya onwe-ya, ma ọ dighi-ab͕anwe okwu-ya.


Ihe-ọlu nile nke onye-aghughọ jọ-kwa-ra njọ: onye ahu ezubewo ihe-nzube ọjọ di iche iche iji okwu-ọnu nile nke bu okwu-ugha mebie ndi ewedara n'ala, ọbuná mb͕e ob͕eye nēkwu okwu ikpé ziri ezi.


Ahuhu gādiri ndi nākpọ ihe ọjọ ezi ihe, ndi nākpọ kwa ezi ihe ihe ọjọ; ndi nētiye ọchichiri n'ọnọdu ìhè, na ìhè n'ọnọdu ọchichiri; ndi nētiye ihe ilu n'ọnọdu ihe utọ, na ihe utọ n'ọnọdu ihe ilu!


Unu gālaghachi kwa hu ihe di iche n'etiti onye ezi omume na onye nēmebi iwu, n'etiti onye nēfè Chineke na onye nādighi-efè Ya.


Biko, ka onye-nwem ghara itukwasi obi-ya n'aru nwoke a jọb͕uru onwe-ya, bú Nebal: n'ihi na dika aha-ya si di, otú a ka ya onwe-ya di; Nebal bu aha-ya, ihe-nzuzu di kwa n'aka-ya: ma mu onwem, bú orù-gi nwayi, ahughm umu-okorọbia onye-nwem, ndi i zitere.


Follow us:

Advertisements


Advertisements