Ndi Livai, bú Jeshua, na Kadmiel, na Bani, na Hashabneia, na Sherebia, na Hodia, na Shebania, na Petahia, we si, Bilienu, gọzie Jehova, bú Chineke-unu, site na mb͕e edighi-ebi rue mb͕e ebighi-ebi: ka ha gọzi kwa aha-Gi di nsọpuru, nke ebuliworo ya elu kari ngọzi na otuto nile.
Gi, Onye-nwe-ayi na Chineke-ayi, I kwesiri inara otuto nile na nsọpuru nile na ike nile: n'ihi na Gi onwe-gi kère ihe nile, ọ bu kwa n'ihi ọchichọ-Gi ka ha diri, ka ekè-kwa-ra ha èkè.
anurum ka ha were oké olu nāsi, O kwesiri, bú Nwa-aturu ahu Nke eb͕uworo eb͕u, inata ike nile, na àkù, na amam-ihe, na ume, na nsọpuru, na otuto, na ngọzi.