Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




2 Samuel 2:5 - Bible Nso

5 Devid we zigara ndikom Jebesh-gilead ndi-ozi, si, ha, Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu, na unu emeworo onye-nwe-unu, bú Sọl, ebere a, unu we líe-ya.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 o zigaara ha ndị ozi ka ha sị ha, “Ka Onyenwe anyị gọzie unu nʼihi obiọma unu gosiri site nʼili Sọl, nna unu ukwu, nʼụzọ kwesiri ekwesi.

See the chapter Copy




2 Samuel 2:5
16 Cross References  

Ọ we gọzie ya, si, Onye agọziri agọzi ka Abram bu site n'aka Chineke Nke kachasi ihe nile elu, bú Onye-nwe elu-igwe na uwa:


Abram we si eze Sọdọm, Eweliwom akam nye Jehova, bú Chineke Nke kachasi ihe nile elu, Onye-nwe elu-igwe na uwa,


nyahuru bu ọbibia-gi, ọ̀ bu ta ka m'gēme gi ka i ṅagharia n'iso ayi je, n'ihi na mu onwem nēje ebe mu onwem nēje? gi laghachi, me kwa ka umu-nne-gi laghachi; ka ebere na ezi-okwu diyere gi.


Devid we je chiri ọkpukpu Sọl na ọkpukpu Jonatan nwa-ya n'aka ndi-nwe Jebesh-gilead, ndi zupuru ha n'amá Bet-shan, ebe ndi Filistia kwubara ha, n'ubọchi ndi Filistia tib͕uru Sọl nime Gilboa:


Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu, Onye meworo elu-igwe na uwa.


Ndikom ahu we si ya, Ndu-ayi lara ndu-unu ka ayi we nwua, ma ọ buru na unu egosighi okwu-ayi nka; ọ gēru kwa, mb͕e Jehova gēnye ayi ala nka, na ayi gēmere gi ebere na ezi-okwu.


Ha we si, Ònye bu onye ahu n'etiti ebo Israel nile nke nārigokuteghi Jehova rue Mizpa? Ma, le, ọ dighi nwoke si na Jebesh-gilead bata n'ọmuma-ulo-ikwū rue nkpọkọta ahu.


Naomi we si nwunye abua nke umu-ya, Jenu, laghachi, nwayi ọ bula n>ulo nne-ya: Jehova mere unu ebere, dika unu mere ndi nwuru anwu, me-kwa-ra mu onwem.


Naomi we si nwunye nwa-ya, Onye agọziri agọzi diri Jehova, ka ọ bu, Onye n=arapughi ebere _O n=emere ndi di ndu na ndi nwuru anwu. Naomi we si ya, Onye-aru-ayi ka nwoke ahu bu, ot#u onye nime ndi-nb͕aputa-ayi ka ọ bu.


_O si, Nwayi agọziri agọzi diri Jehova ka i bu, nwam: i mewo ebere nke-ọma n>ikpe-azu kari na mbu, ebe i n=ejesoghi umu-okorọbia, ma ọ bu onye n=enweghi ike ma-ọbu ọgaranya.


Nehash, bú onye Amon, we rigota, ma ulo-ikwū-ya imegide Jebesh-gilead: ndikom nile nke Jebesh we si Nehash, Ka ayi na gi b͕a ndu, ayi gēfè kwa gi òfùfè.


Ha we si ndi-ozi biara, Otú a ka unu gāsi ndikom Jebesh-gilead, Echi ka nzọputa gādiri unu, mb͕e anyanwu nēkpo ọku. Ndi-ozi ahu we bia gosi ndikom Jebesh; ha we ṅuria ọṅu.


Samuel we biakute Sọl: Sọl we si ya, Onye agọziri agọzi n'ebe Jehova nọ ka i bu: emewom ka okwu Jehova guzosie ike.


Sọl we si, Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu; n'ihi na unu enwewo ọmiko n'arum.


Ma mb͕e madu gāchọta onye-iro-ya, ò gēzilaga kwa ya n'ezi uzọ? Jehova kwughachi kwa gi ezi ihe n'ọnọdu ihe a i meworom ta.


Follow us:

Advertisements


Advertisements