Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




2 Samuel 17:8 - Bible Nso

8 Hushai we si, Gi onwe-gi amawo nna-gi na ndikom-ya, na ndi-dike ka ha bu, ndi nkpuru-obi-ha di ilu ka ha bu kwa, dika bear ab͕abara aka nwa n'ọhia: nna-gi bu kwa nwoke agha, ọ gaghi-esoro kwa ndi-ya nọ ọnọdu abali.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ọ sịrị, Gị onwe gị maara nna gị na ndị ikom ya; ha bụ ndị dike nʼagha, mkpụrụobi ha dịkwa ilu ugbu a dịka anụ ọhịa bịa a gbabara aka nwa nʼọhịa. Nna gị bụ onye ihe banyere agha doro anya. Ọ gaghị eso ndị ya nọọ ọnọdụ abalị.

See the chapter Copy




2 Samuel 17:8
20 Cross References  

Ndi-orù-ya nile we nāgabiga n'akuku ya; ndi Keret nile, na ndi Pelet nile, na ndi Gat nile, bú nnù ndikom na ọgu iri ndi siri na Gat bia, soro ya n'ukwu n'ukwu, nāgabiga kwa n'iru eze.


Le, ub͕u ya onwe-ya ezowo onwe-ya n'otù olùlù ma-ọbu n'otù nime ọnọdu-ya: o gēru kwa, mb͕e ufọdu nime ha dara na nmalite, na onye ọ bula nānu ya gāsi, Ntib͕u di n'etiti ndi ahu nke nēso Absalom.


Ndi-dike atọ ahu we wapue ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia, sere miri n'olùlù-miri Bet-lehem, nke di n'ọnu-uzọ-ama, ha we būru ya, kutere Devid: ma o kweghi iṅu ya, o we wusiere ya Jehova.


Ma Abishai, bú nwa-nne Joab, nwa Zeruaia, onye ahu bu onye-isi ndikom atọ ahu. Onye ahu feghari-kwa-ra ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u, o we nwe aha n'etiti ndikom atọ ahu.


Ọ le anya n'azu-ya, hu ha, kọcha ha n'aha Jehova. Nne anu-ọhia bear abua we si n'oké ọhia puta, dọka ọgu umu-okoro abua na abua n'etiti ha.


Ka nne-bear nke b͕ara aka umu-ya zute madu, Kari onye-nzuzu n'uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ.


Ọdum nke nāb͕o uja na anu-ọhia bear nke nāb͕aghari Ka onye nēmebi iwu nke nāchi ndi nēnweghi ike bu.


si, Gini ka nne-gi bu? Ọ bu nne-ọdum: n'etiti ọdum ka ọ makpuru, n'etiti umu-ọdum ka o mere ka umu-ya ba uba.


Ma le, anu ọzọ, nke mere ha abua, nke yiri bear, ma n'otù akuku ka emere ya ka o bilie, ọgiriga atọ di kwa n'ọnu-ya n'etiti ezé-ya: ọ bu kwa otú a ka ha nāsi ya, Bilie, rie ọtutu anu.


M'gādakwasi ha dika anu-ọhia bear nke b͕ara aka nwa, M'gādọwa anu-aru b͕ochiri obi-ha: M'gēri ha n'ebe ahu dika ọdum; anu ọhia gādọka ha.


Umu Dan we si ya, Ka aghara inu olu-gi n'etiti ayi, ka ndikom ndi nkpuru-obi-ha di ilu we ghara idakwasi unu, i we kpochapu ndu-gi na ndu ezi-na-ulo-gi.


Otù nime umu-okorọbia-ya we za, si, Le, ahuwom otù nwa Jesi, bú onye Bet-lehem, onye mara ikpọ ubọ nke-ọma, ọ bu kwa dike nke bu dìnkpà, buru kwa nwoke agha, o nwe-kwa-ra uche n'okwu, buru kwa nwoke mara nma n'aru, Jehova nọye-kwa-ra ya.


Devid we were èbè, were kwa nkume, kwa onye Filistia n'ike, o we tib͕ue onye Filistia ahu, me ka ọ nwua; ma mma-agha adighi n'aka Devid.


Ma hunu, we mara ebe-izo-nzuzo nile ebe o nēzo onwe-ya, unu biaghachikutekwam mb͕e unu dozisiri onwe-unu, m'gēso kwa unu je: o gēru kwa, ọ buru na ọ nọ n'ala nka, na m'gāchọputa ya n'usu nnù ndikom Juda abua na ọgu iri nile.


Follow us:

Advertisements


Advertisements