2 Samuel 10:8 - Bible Nso8 Umu Amon we puta, do agha n'usoro n'oghere ọnu-uzọ-ama: Siria Zoba, na Rehob, na ndikom Tob, na Meaka, nọrọ onwe-ha n'ọhia. See the chapterBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a8 Ndị Amọn pụtara doo onwe ha nʼusoro ibu agha, nʼọnụ ụzọ ama nke obodo ha. Ma ndị Aram, ndị si Zoba na Rehob, na ndị ikom Tob na Maaka, nọpụrụ onwe ha na mbara ala. See the chapter |