Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




1 Samuel 26:12 - Bible Nso

12 Devid we were ube na ite miri site n'akuku isi Sọl; ha we la, ma ọ dighi onye nāhu ha, ọ dighi kwa onye mara, ọ dighi kwa onye nēteta: n'ihi na ha nile nāraru ura; n'ihi na oké ura nke Jehova dakwasiri ha.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Devid weere ùbe ya na ite mmiri dị nʼakụkụ isi Sọl, ha sitere nʼebe ahụ pụọ. Ọ dịkwaghị onye hụrụ ha. Ọ dịkwaghị onye tetara, nʼihi na Onyenwe anyị mere ka ha daba nʼoke ụra.

See the chapter Copy




1 Samuel 26:12
7 Cross References  

O rue, mb͕e anyanwu gaje ida, na oké ura dakwasiri Abram; ma, le, oké ujọ, bú ọchichiri uku, nādakwasi ya.


Jehova, bú Chineke, we me ka oké ura dakwasi madu ahu, o we raru ura; O we weputa otù nime ọgiriga-ya, mechie anu-aru n'ọnọdu-ya:


N'abali ahu urá eze fepuru n'anya-ya; o we si ka ewebata akwukwọ ihe-ncheta nke ihe emere n'ubọchi ahu, ewe nāgu ha n'iru eze.


N'ihi na Jehova awukwasiwo unu mọ nke oké ura, we mechisie anya-unu ike, bú ndi-amuma; isi-unu, bú ndi-ọhù, ka O kpuchiwo-kwa-ra.


Ndikom Devid we si ya, Le, ubọchi nke Jehova siri gi, Le, Mu onwem nēnye onye-iro-gi n'aka-gi, i gēme kwa ya dika o si di nma n'anya-gi. Devid we bilie, were nzuzo bipu ọnu-ọnu uwe-nwuda nke Sọl nwere.


Devid we gabiga n'ofè ọzọ, guzo n'elu ugwu n'ebe di anya; ebe-mbara n'etiti ha riri nne:


Devid na Abishai we biakute ndi Israel n'abali: ma, le, Sọl nēdina n'ura n'ebe anēdebe ub͕ọ-ala, atugide-kwa-ra ube-ya n'ala n'akuku isi-ya: Abnea na ndi Israel nēdina kwa ya buruburu.


Follow us:

Advertisements


Advertisements