Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




1 Samuel 2:23 - Bible Nso

23 O we si ha, N'ìhi gini ka unu nēme ihe dika ihe ndia? n'ihi na mu onwem nānu ihe ọjọ nile unu n'ọnu ndi nka nile.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Ya mere, Elayị gwara ụmụ ya sị, “Anụla m site nʼọnụ ndị Onyenwe anyị, banyere ihe ọjọọ niile dị iche iche unu na-eme. Gịnị mere unu ji na-eme ihe ọjọọ dị otu a?

See the chapter Copy




1 Samuel 2:23
9 Cross References  

Ma ọ dighi mb͕e nna-ya mere ihe nēwuta ya n'ubọchi ndu-ya nile, si, Gini mere i meworo otú a? ọzọ kwa, onye ahu bu onye di nma n'aru nke-ukwu; nne-ya mu-kwa-ra ya mb͕e amusiri Absalom.


Nmata ha nāmata iru madu n'ikpe azawo megide ha; nmehie-ha ka ha gosiwo-kwa-ra dika Sọdọm, ha ezobeghi ya. Ahuhu gādiri nkpuru-obi-ha! n'ihi na ha emesowo onwe-ha ihe ọjọ.


Ewe b͕ochie oké miri-ozuzo nile, miri-ozuzo ikpe-azu adighi kwa; ma egedege-iru nke nwayi nākwa iko ka i nwere, i juru ka etiye gi n'ọnọdu-ihere.


ọ̀ di ihere mere ha megbe ha mere ihe-árú? é-è, ihere adighi-eme ha ma-ọli, ọ dighi kwa itiye-n'ọnọdu-ihere ha mara: n'ihi nka ha gāda n'etiti ndi nāda ada: na mb͕e eletara ha ha gāsu ngọngọ, ka Jehova siri.


nāsi, Ndikom, gini mere unu nēme ihe ndia? Ayi onwe-ayi bu kwa madu yiri unu n'aru-ayi, ayi nēzì kwa unu ozi ọma, ka unu si n'ihe-efu ndia chigharikute Chineke Nke di ndu, Onye kère elu-igwe na ala na oké osimiri, na ihe nile di ha nime:


o we da n'ala, nu otù olu ka ọ nāsi ya, Sọl, Sọl, gini mere i nēsob͕um?


ndi ọgwugwu-ha bu ila-n'iyì, ndi chi-ha bu afọ-ha, ndi otuto-ha di kwa n'ihere-ha, ndi nātukwasi uche n'ihe uwa.


Ma Ilai emewo agadi nke-uku; o we nu ihe nile umu-ya ndikom nēme Israel nile, na otú ha nēso ndinyom ahu dina, bú ndi nēzukọ n'usu n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.


É-è, umum; n'ihi na ọ dighi nma, bú akukọ nke mu onwem nānu: unu nēme ka ndi Jehova jehie.


Follow us:

Advertisements


Advertisements