Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




1 Samuel 2:18 - Bible Nso

18 Ma Samuel nēje ozi n'iru Jehova, buru nwata, ewerewo kwa ephod nke ákwà ọcha ke ya dika ihe-ọkiké.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Nʼoge a, Samuel na-agakwa ozi ya nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ ezie na ọ bụ naanị nwantakịrị, ọ na-eyi akwa ọcha efọọd dịka ndị nchụaja.

See the chapter Copy




1 Samuel 2:18
9 Cross References  

Devid were kwa ike-ya nile te egwún'iru Jehova; ewere ephod ákwà ọcha ke Devid n'ukwù.


Ewere kwa uwe-nwuda nke ezi ákwà ọcha ke Devid ekike, ya na ndi Livai nile ndi nēbu ib͕e ahu, na ndi-ọbù-abù, na Kenania, bú onye-isi n'ibū ibu ahu tiyere ndi-ọbù-abù: ephod ákwà ọcha di kwa n'aru Devid.


Ndia bu uwe ha gēme; ihe-ib͕ochi-obi, na ephod, na uwe-nwuda, na uwe-ime turu agwa, na nkechi isi, na ihe ike n'úkwù: ha gēme-kwa-ra Eron, bú nwa-nne-gi, na umu-ya ndikom, uwe nsọ, ka ọ we burum onye-nchu-àjà.


O tiye n'aru ya uwe-ime ahu, were ihe ike n'úkwù ke ya, yikwasi ya uwe-nwuda, tiye ephod n'aru ya, ke ya n'ihe-ọkiké ephod nke onye-ọ̀kà kpara, were ya kegide ephod ahu n'aru ya.


Ahaija, nwa Ahaitub, nwa-nne Ikabod, nwa Finehas, nwa Ilai, bú onye-nchu-aja Jehova na Shailo, nọ kwa, ọ nēyi ephod. Ndi ahu amaghi kwa na Jonatan ejewo.


Elkena we la Rema rue ulo-ya. Nwata ahu we nējere Jehova ozi n'iru Ilai, bú onye-nchu-àjà.


Èsim n'ebo nile nke Israel rọputa ya iburum onye-nchu-àjà, irigo rue ebe-ichu-àjàm, isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, iyiri ephod n'irum? ènye-kwa-ram ulo nna-gi àjà-ọku nile nke umu Israel?


Eze we si Doeg, Gi onwe-gi chigharia, dakwasi ndi-nchu-àjà. Doeg onye Edom we chigharia, ya onwe-ya we dakwasi ndi-nchu-àjà, me ka ọgu ndikom anọ na ise nwua n'ubọchi ahu, bú ndi nēyi ephod nke ákwà ọcha.


Nwata ahu, bú Samuel, we nējere Jehova ozi n'iru Ilai. Okwu Jehova we di oké ọnu na mb͕e ahu; ọ dighi ọhù ekwusara.


Follow us:

Advertisements


Advertisements