Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




1 Samuel 18:1 - Bible Nso

1 O rue, mb͕e ọ gwabìri Sọl okwu, na ekekọtara nkpuru-obi Jonatan na nkpuru-obi Devid, Jonatan we hu ya n'anya dika nkpuru-obi-ya.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mgbe Devid gwasịrị Sọl okwu, ịhụnanya dị ukwuu malitere nʼetiti Jonatan na Devid. Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka o si hụ onwe ya.

See the chapter Copy




1 Samuel 18:1
17 Cross References  

Ma ub͕u a, mb͕e m'gābiakute orù-gi, bú nnam, ma nwa-okoro ahu esoghi ayi bia; ebe ekekọtara nkpuru-obi-ya na nkpuru-obi nwa-okoro ahu;


Anọm na nkpà n'ihi gi, nwa-nnem Jonatan: I di utọ nke-uku n'ebe m'nọ: Ihu-n'anya-gi nke i hurum di ebube, Kari ihu-n'anya ndinyom.


Devid we pua izute ha, o we za, si ha, Ọ buru na unu abiakutem n'uzọ udo iyerem aka, enwerem obi ọma n'aru unu ka mu na unu buru otù: ma ọ buru na unu abiawo iwere aghughọ nyem n'aka ndi nākpab͕um, mb͕e ihe-ike nādighi n'akam, ka Chineke nna-ayi-hà hu ya, bara unu nba.


Zim uzọ-Gi Jehova; m'gējeghari n'ezi-okwu-Gi: Me ka obim di n'otù itu egwu aha-Gi.


Onye nēnwe ọtutu eyì nēnwe ha ibibi onwe-ya: Ma onye nāhu n'anya di nārapara n'aru kari nwa-nne.


Mb͕e nwa-nne-gi nwoke, bú nwa nke nne-gi, ma-ọbu nwa-gi nwoke, ma-ọbu nwa-gi nwayi, ma-ọbu nwunye nke obi-gi, ma-ọbu eyì-gi, nke di ka nkpuru-obi-gi, gārafu gi na nzuzo, si, Ka ayi je fè chi ọzọ, (nke ọ nādighi mb͕e i mara ha, gi onwe-gi, ma-ọbu nna-gi-hà;


ka ewe kasie obi-ha, ebe ejikọ-kwa-ra ha n'ihu-n'anya, ka ha we ru kwa àkù nile nke nkwezu ahu nke nghọta nēkwezu, ka ha we mazu ihe-omimi nke Chineke, bú Kraist,


Ndikom nile nke Israel we chikọta onwe-ha imegide obodo ahu, dika otù nwoke ka ejikọtara ha n'otù.


Ndi Israel we si Sọl, Jonatan, ọ̀ gānwu, bú onye zọputara nzọputa uku a n'Israel? ya buru ihe-árú: Jehova nādi ndu, ọ dighi otù nime agiri-isi nke isi-ya gādaru ala; n'ihi na ya na Chineke aluwo ọlu ta. Ndi Israel we b͕aputa Jonatan, o we ghara inwu.


Jonatan na Devid we b͕a ndu, n'ihi na ọ huru ya n'anya dika nkpuru-obi-ya.


Sọl we gwa Jonatan nwa-ya na ndi-orù-ya nile okwu, ka ha me ka Devid nwua.


Ma ihe Devid tọrọ Jonatan nwa Sọl utọ nke-uku. Jonatan we gosi Devid, si, Sọl, bú nnam, nāchọ ime ka i nwua: ma ub͕u a, biko, lezie onwe-gi anya n'ututu, nọdu n'ebe di nzuzo, zo onwe-gi:


Jonatan we me kwa ka Devid ṅua iyi ọzọ, n'ihi na ọ huru ya n'anya: n'ihi na dika ọ huru nkpuru-obi nke onwe-ya n'anya, otú a ka ọ huru Devid n'anya.


Ma i gēmere orù-gi ebere; n'ihi na i mere ka orù-gi soro gi ba n'ọb͕ub͕a-ndu Jehova: ma ọ buru na ajọ omume di nimem, gi onwe-gi me ka m'nwua; ma n'ìhi gini kwa ka i gēme ka m'bakuru nna-gi?


na unu nile ekekọtawo onwe-unu imegidem, ọ dighi kwa onye nēkpughepu ntim ka m'nu ya mb͕e nwam na nwa Jesi b͕ara ndu, ọ dighi kwa onye nime unu ọ nēb͕u nb͕u n'obi n'ihim, ma-ọbu nke nēkpughepu ntim ka m'nu na nwam emewo ka orùm bilie imegidem, iche anwu, dika ta.


Ha abua we b͕a ndu n'iru Jehova: Devid we nọdu n'oké ọhia, ma Jonatan lara n'ulo-ya.


Follow us:

Advertisements


Advertisements