Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




1 Samuel 15:9 - Bible Nso

9 Ma Sọl na ndi Israel nwere ọmiko n'aru Egag, na n'aru anu kachasi nma nke ìgwè ewu na aturu, na nke ìgwè ehi, na nke umu anu mara abuba, na n'aru umu-aturu, na n'aru ihe nile di nma, ha ekweghi kwa iwezuga ha ka ebibie ha: ma anu-ulo ọ bula nke di nlelì nke ta-kwa-ra aru, nke ahu ka ha wezugara ka ebibie ya.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ma Sọl na ndị agha ya debere Agag ndụ, debekwa atụrụ na ehi kachasị mma, na ụmụ ebule na atụrụ gbara abụba, na ihe ndị ọzọ niile mara mma. Nʼezie, ihe ọbụla dị mma nʼanya ka ha jụrụ ibibi. Ma ihe ndị ọzọ niile nke na-amasịghị ha, na nke na-abaghị uru, ka ha bibiri.

See the chapter Copy




1 Samuel 15:9
10 Cross References  

O rue, mb͕e ndi nēbu ib͕e Jehova zọrọ nzọ-ukwu isi, na ọ churu ehi na nwa-ehi mara abuba n'àjà.


Ben-hedad we si ya, Obodo nile nke nnam nara n'aka nna-gi, m'gēnyeghachi gi ha; i gākwa-kwa-ra onwe-gi amá nime Damaskọs, dika nnam kwara nime Sameria. Ma mu onwem, ka Ehab kwuru, n'ọb͕ub͕a-ndu nka ka m'gēzilaga gi. Ya na ya we b͕a ndu, o we zilaga ya.


N'ihi na apuru ire manu-otite a oké ọnu-ahia, we nye ndi-ob͕eye.


Ma otú ọ di, unu onwe-unu debenu onwe-unu ka unu ghara imetu ihe ewezugara nye Jehova aka, ka unu we ghara iwere ihe ahu ewezugara, mb͕e unu wezugasiri ya; unu ewe me ka ọmuma-ulo-ikwū Israel buru ihe ewezugara ka ebibie ya, unu ewe mekpa ya aru.


m'we hu n'etiti ihe-nkwata otù ezi uwe-nwuda nke Shaina, na ọgu shekel ọla-ọcha iri, na otù nkpirikpi ọla-edo nke ọtùtù-ya di ọgu shekel abua na iri, m'we nwe anya-uku n'ebe ha di, m'we chiri ha; ma, le, ezoworo ha n'ala n'etiti ulo-ikwūm, ọla-ọcha ahu di kwa n'okpuru ya.


Okwu Jehova we rue Samuel nti, si,


Sọl we si, Ọ bu n'etiti ndi Amalek ka ha si chita ha: n'ihi na ndi Israel nwere ọmiko n'aru anu kachasi nma nke ìgwè ewu na aturu na nke ìgwè ehi, ka ha we chuara Jehova, bú Chineke-gi, àjà; ma ayi ewezugawo nke fọduru ka ebibie ya.


N'ìhi gini kwa ka i nēgeghi nti olu Jehova, kama i dakwasiri ihe-nkwata, we me ihe ọjọ n'anya Jehova?


Ub͕u a je tib͕ue Amalek, wezuga ihe nile ọ bula o nwere ka ebibie ya, enwe-kwa-la ọmiko n'aru ya; kama me ka ha nwua, ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, ma ehi ma aturu, ma camel ma inyinya-ibu.


N'ihi na i geghi nti olu Jehova, i meghi kwa ka idi-ọku nke iwe-Ya dakwasi Amalek, n'ihi ya ka Jehova meworo gi ihe a ta.


Follow us:

Advertisements


Advertisements