Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




1 Samuel 15:1 - Bible Nso

1 Samuel we si Sọl, Mu ka Jehova zitere ite gi manu ka i buru eze ndi-Ya, bú Israel: ma ub͕u a ge nti olu okwu Jehova.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Samuel sịrị Sọl, “Mụ ka Onyenwe anyị zitere ite gị mmanụ ka ị bụrụ eze ndị ya, bụ Izrel. Ya mere, gee ntị nʼozi sitere nʼaka Onyenwe anyị bịa.

See the chapter Copy




1 Samuel 15:1
10 Cross References  

Elaisha we si, Nurunu okwu Jehova: otú a ka Jehova siri, Dika mb͕e a echi agēre otù mb͕é utu ọka flour otù shekel, na mb͕é barley abua otù shekel, n'ọnu-uzọ-ama Sameria.


Samuel we were karama manu, wukwasi ya n'isi-ya, sutu ya ọnu, si, Ọ̀ bughi na Jehova etewo gi manu ibu onye-ndú ihe-nketa-Ya?


Ọ buru na unu atua egwu Jehova, ọ buru kwa na unu efè Ya òfùfè, we ge nti olu-Ya, ọ buru kwa na unu anupughi isi n'okwu-ọnu Jehova, kama na unu nēsogide Jehova, bú Chineke-unu, ma unu onwe-unu ma eze-unu kwa nke bu eze-unu, ọ di nma:


Samuel we si Sọl, I mewo ihe-nzuzu: i debeghi ihe Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, bú nke O nyere gi n'iwu: n'ihi na ub͕u a Jehova gēmewori ka ala-eze-gi guzosie ike n'ebe Israel nọ rue mb͕e ebighi-ebi.


Ma Jehova kpughepuru nti Samuel ka ọ nu ihe otù ubọchi tutu Sọl abia, si,


Dika mb͕e a echi M'gēzitere gi otù nwoke sitere n'ala Benjamin, i gēte kwa ya manu ibu onye-ndú ndim, bú Israel, ọ gāzọputa kwa ndim n'aka ndi Filistia: n'ihi na ahuwom ndim, n'ihi na iti-nkpu-ha abàwom na nti.


Follow us:

Advertisements


Advertisements