Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




1 Samuel 13:7 - Bible Nso

7 Ma ndi-Hibru ufọdu gabigara Jọdan rue ala Gad na Gilead; ma Sọl nọgidere na Gilgal, ndi Israel nile ma-kwa-ra jijiji nēso ya n'azu.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ndị Hibru ụfọdụ gafere Jọdan ruo nʼala Gad na Gilead. Nʼoge a, Sọl nọ na Gilgal, ndị agha niile ya na ha nọ na-amakwa jijiji nʼihi ụjọ.

See the chapter Copy




1 Samuel 13:7
15 Cross References  

M'gēche irum imegide unu, agētib͕u kwa unu n'iru ndi-iro-unu: ndi nākpọ unu asì gāzọda unu; unu gāb͕alaga kwa mb͕e ọ nādighi onye nāchu unu.


Ndi-ọchi-agha gāgwa kwa ndi Israel okwu ọzọ, si, Ònye bu nwoke nke nātu egwu, nke obi nālọ kwa ya miri? ya je laghachi n'ulo-ya, ka obi umu-nne-ya we ghara imebi dika obi-ya.


Jehova gēme ka etib͕ue gi n'iru ndi-iro-gi: n'otù uzọ ka i gāpukuru ha, ma n'uzọ asa ka i gāb͕alaga n'iru ha: i gāghọ-kwa-ra ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari.


Ala nka ka ayi nweta-kwa-ra mb͕e ahu: site n'Aroea, nke di n'akuku ndagwurugwu Anon, na nkera ugwu Gilead, na obodo nile ya, ka m'nyere ndi Reuben nye kwa ndi Gad:


na Gilead, na ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat, na ugwu Heamon nile, na Beshan nile rue Saleka;


Ndi Reuben na ndi Gad soro ya nara ihe-nketa-ha, nke Moses nyere ha, n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu, dika Moses, bú orù Jehova, nyere ha;


Ma ub͕u a, biko, kpọ òkù na nti ndi nka, si, Ònye nātu egwu, nāma kwa jijiji? ya laghachi, si n'ugwu Gilead b͕alaga. Orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise we si na ndi Israel laghachi; ma orú nnù ndikom na nnù ise fọduru.


O we chere ubọchi asa, dika mb͕e akara àkà si di nke Samuel kara: ma Samuel abiarughi Gilgal; ndi Israel we si n'ebe ọ nọ b͕asa.


Sọl na Israel nile we nu okwu nile ndia nke onye Filistia, ha we tua ujọ, tua egwu nke-uku.


Ndikom Israel ndi nọ n'ofè ọzọ ndagwurugwu ahu, na ndi nọ n'ofè Jọdan, we hu na ndikom Israel ab͕alagawo, hu kwa na Sọl na umu-ya ndikom anwuwo, ha we rapu obodo nile ha, b͕alaga; ndi Filistia we bia biri nime ha.


Follow us:

Advertisements


Advertisements