site-kwa-nu n'ekpere na aririọ nile nēkpe ekpere n'oge nile nime Mọ Nsọ, were kwa inọgidesi-ike na iriọ-aririọ nile bayere ndi nsọ nile nāmu anya ime nka,
Ya mere, nēkwuputanu nmehie nile unu gwarita ibe-unu, nēkpe kwa ekpere n'ihi ibe-unu, ka ewe me ka aru di unu ike. Aririọ nke onye ezi omume di ike nke-uku n'ilusi-ọlu-ike-ya.
Ọ we kwe nkwa, si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ buru na I lekwasi anya n'ezie na nweda-n'ala nke orù-Gi nwayi, ọ buru na I chetam, ghara ichezọ orù-Gi nwayi, we nye orù-Gi nwayi nwa-nwoke, m'gēnye kwa ya Jehova ubọchi ndu-ya nile, aguba agaghi-aga kwa n'elu isi-ya.