Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




1 Samuel 1:1 - Bible Nso

1 Ma otù nwoke nke Ramataim-zofim, nke ugwu Efraim, di, aha-ya bu Elkena, nwa Jeroham, nwa Elaihu, nwa Tohu, nwa Zuf, onye Efrata:

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 O nwere otu nwoke onye Zuf, si na Ramataim, nʼala ugwu ugwu Ifrem. Aha ya bụ Elkena nwa Jeroham, nwa Elihu, nwa Tohu, nwa Zuf, onye Ifrem.

See the chapter Copy




1 Samuel 1:1
21 Cross References  

Ma Jeroboam nwa Nebat, onye Efrata nke Zerida, bu orù Solomon nwere, aha nne-ya bu Zerua, nwayi di-ya nwuru, o weli-kwa-ra aka-ya megide eze.


Ahaitub mua Zedok, Zedok mua Shalum;


Umu-ndikom Kohat; Aminadab nwa-ya, Kora nwa-ya, Asia nwa-ya;


Ndia bu kwa ndi nēguzo, ha na umu-ha ndikom. Nime umu-ndikom ndi Kohat: Himan ọbù-abù, nwa Joel, nwa Samuel;


nwa Elkena, nwa Jeroham, nwa Eliel, nwa Toa;


Ma mb͕e o ruru anyasi, otù ọgaranya, aha-ya bu Josef, onye ya onwe-ya bu kwa onye nēso uzọ Jisus, si n'Arimatia bia:


Eleeza nwa Eron we nwua; ha we lìe ya n'ugwu Finehas nwa-ya, nke enyere ya n'ugwu Efraim.


Gilead we were ngabiga-miri Jọdan nile n'uzo ije Efraim: o rue, mb͕e ndi b͕apuru ab͕apu nke Efraim siri, Ka m'gabiga, na ndikom Gilead siri ya, Ọ̀ bu onye Efraim ka i bu? Ọ si, É-è;


Ma otù nwoke nke ugwu Efraim di, aha-ya bu Maika.


O rue, na mb͕e ahu, mb͕e eze nādighi n'Israel, na otù nwoke, bú onye Livai, di nānọ dika ọbìa n'akuku azu ugwu Efraim, o we si na Bet-lehem-juda kuru n'onwe-ya nwayi bu iko.


Nwayi ahu bi kwa n'okpuru nkwu Debora n'etiti Rema na Bet-el n'ugwu Efraim: umu Israel we rigokute ya ka o kpe ha ikpe.


Aha nwoke ahu bu Elimelek, aha nwunye-ya bu Naomi, aha umu-ya ndikom abua bu Mahlon na Kilion, ndi Efrat nke Bet-lehem-juda. Ha we ba n>ala-ọhia Moab, nọ n>ebe ahu.


Obed we mua Jesi, Jesi we mua Devid.


Ha we bilie n'isi-ututu, kpọ isi ala n'iru Jehova, we lata, ba n'ulo-ha, rue Rema: Elkena we mara aru Hana nwunye-ya; Jehova we cheta ya.


Ma Devid bu nwa onye Efrat ahu nke Bet-lehem-juda, nke aha-ya bu Jesi; o nwe-kwa-ra umu-ndikom asatọ: nwoke ahu aghọwo kwa agadi n'etiti ndikom n'ubọchi Sọl.


Elkena we la Rema rue ulo-ya. Nwata ahu we nējere Jehova ozi n'iru Ilai, bú onye-nchu-àjà.


Nlata-ya bu na Rema, n'ihi na n'ebe ahu ka ulo-ya di; ọ bu kwa n'ebe ahu ka ọ kpere Israel ikpe: o we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu.


O we gabiga n'ugwu Efraim, gabiga kwa n'ala Shalisha, ma ha achọtaghi ha: ha we gabiga n'ala Shaalim, ma ha adighi n'ebe ahu: o we gabiga n'ala Benjamin, ma ha achọtaghi ha.


Mb͕e ndi ahu batara n'ala Zuf, Sọl siri nwa-okorọbia-ya nke soro ya je, Bia, ka ayi laghachi; ka nnam we ghara igha iche uche bayere nne-inyinya-ibu-ya, we cheb͕u onwe-ya bayere ayi.


Follow us:

Advertisements


Advertisements