Levitikọs 14:13 - Bible Nso13 o gēb͕u kwa nwa-ebulu ahu n'ebe o nēb͕u àjà-nmehie na àjà-nsure-ọku, n'ebe nke ebe nsọ ahu; n'ihi na, dika àjà-nmehie, àjà-ikpe-ọmuma bu ihe onye-nchu-àjà nwere: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu: Viz kapitolaBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a13 Ọ ga-egbu nwa ebule ahụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, nʼebe a na-anọ egbu anụ aja mmehie na aja nsure ọkụ. Ọ bụ onye nchụaja ga-ewere anụ aja ikpe ọmụma a, dịka o were nke aja mmehie. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ. Viz kapitola |