Jud 1:4 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a4 Nʼihi na ụfọdụ mmadụ, bụ ndị e dere ihe banyere ọmụma ikpe dịrị ha, siterị nʼoge gara aga, ezobatala nʼetiti unu. Ha bụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị na-agbanwe amara Chineke anyị, mee ya ka ọ bụrụ ohere ha nwere ibi ndụ ịkwa iko, na nke ịgọnarị Jisọs Kraịst, onye naanị ya bụ Onye kachasị ihe niile elu na Onyenwe. Viz kapitolaBible Nso4 N'ihi na madu ufọdu b͕ebàra, bú ndi ewereworo ha gosi ọra madu mb͕e ochie ka ewe ma ha ikpé a, ndi nādighi-asọpuru Chineke, ndi nāgha amara Chineke-ayi ka ọ buru agu ikwa-iko, ndi nāgọnari kwa Onye nání Ya bu Nna-nwe-ọra, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist. Viz kapitola |