Matiu 3 - Bible Nso1 Ma na mb͕e ahu Jọn Baptist biara, nēkwusa n'ọhia nke Judia, 2 si, Chègharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso. 3 N'ihi na nwoke a bu onye ekwuru okwu bayere ya site n'ọnu Aisaia onye-amuma, si, Olu otù onye nēti nkpu n'ọhia, si, Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi, Menu okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie. 4 Ma Jọn onwe-ya nwere uwe-oyiyi-ya nke aji camel, nēke kwa akpukpọ-ọkiké n'úkwù-ya; nri-ya bu kwa igurube na manu-aṅu nke ọhia. 5 Mb͕e ahu Jerusalem, na Judia nile, na ala nile di Jọdan buruburu, nāpukuru ya; 6 ọ nēme kwa ha baptism n'osimiri Jọdan, ha nēkwuputa nmehie nile ha. 7 Ma mb͕e ọ huru ọtutu madu nime ndi-Farisi na ndi-Sadusi ka ha nābia baptism-ya, ọ siri ha, Unu umu nke aju-ala, ònye gosiri unu ka unu b͕anari iwe gaje ibia? 8 Ya mere, mianu nkpuru kwesiri nchèghari-unu; 9 unu echè-kwa-la ikwu nime onwe-unu, si, Ayi nwere Abraham na nna: n'ihi na asim unu, na Chineke puru ime ka umu tolitere Abraham site na nkume ndia. 10 Ma ọbuná ub͕u a anātukwasi anyu-ike na nkpọrọgwu osisi nile: ya mere anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku. 11 Mu onwem nēji miri me unu baptism n'ezie ka unu we chègharia: ma Onye nke nābia n'azum kam ike, Onye m'nērughi ichi akpukpọ-ukwu-Ya: Onye ahu gēji Mọ Nsọ na ọku me unu baptism: 12 Onye ihe-ifucha-ọka-Ya di n'aka-Ya, Ọ gāfuchapu kwa ebe-nzọcha-ọka-Ya nke-ọma, Ọ gēkpokọta kwa ọka-Ya n'ọba-Ya, ma Ọ gēji ọku anāpughi imenyu emenyu rechapu ib͕ob͕o. 13 Mb͕e ahu Jisus siri na Galili bia rue Jọdan jekuru Jọn ahu, ka o we me Ya baptism. 14 Ma Jọn nēb͕ochi Ya, si, Ọ di mu onwem nkpà ka I mem baptism, Gì onwe-gi nābiakutekwam? 15 Ma Jisus zara, si ya, Kwerem ub͕u a: n'ihi na otú a ka ọ kwesiri ayi imezu ezi omume nile. Mb͕e ahu o kwere Ya. 16 Ma mb͕e emere Jisus baptism, ngwa ngwa O si na miri rigota: ma le, emeghere elu-igwe nye Ya, O we hu Mọ nke Chineke ka Ọ nēfeda dika ndùrù, nēbekwasi kwa Ya; 17 ma le, olu sitere n'elu-igwe, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria