Levitikọs 18 - Bible Nso1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 3 Unu emela dika omume ala Ijipt, nke unu biri nime ya: unu eme-kwa-la dika omume ala Kenean, nke Mu onwem nēme ka unu ba n'ebe ahu: unu ejeghari-kwa-la n'ukpuru nile ha. 4 Ikpém nile ka unu gēme, ọ bu kwa ukpurum nile ka unu gēdebe, ijeghari nime ha: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. 5 Unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile: nke madu gēme, di ndu nime ha: Mu onwem bu Jehova. 6 Nwoke ọ bula abiarula nso onye-aru-ya ọ bula, ikpughe ọtọ-ya: Mu onwem bu Jehova. 7 Ekpughela ọtọ nna-gi, bú ọtọ nne-gi: nne-gi ka ọ bu; ekpughela ọtọ-ya. 8 Ekpughela ọtọ nwunye nna-gi: ọtọ nna-gi ka ọ bu. 9 Ọtọ nwa-nne-gi nwayi, bú nwa nke nna-gi ma-ọbu nwa nke nne-gi, nke amuru n'ulo, ma-ọbu nke amuru n'èzí, ekpughela ọtọ-ha. 10 Ọtọ nwa-nwayi nke nwa-gi nwoke, ma-ọbu ọtọ nwa-nwayi nke nwa-gi nwayi, ekpughela ọtọ-ha: n'ihi na ọtọ-gi ka ọtọ-ha bu. 11 Ọtọ nwa-nwayi nke nwunye nna-gi, nke nna-gi muru, nwa-nne-gi nwayi ka ọ bu, ekpughela ọtọ-ya. 12 Ekpughela ọtọ nwa-nne-nwan yi nke nna-gi: onye-aru nna-gi ka ọ bu. 13 Ekpughela ọtọ nwa-nne-nwan yi nke nne-gi: n'ihi na onye-aru nne-gi ka ọ bu. 14 Ekpughela ọtọ nwa-nne-nwoke nke nna-gi, abiarula nwunye-ya nso: nwunye nwa-nne nna-gi ka ọ bu. 15 Ekpughela ọtọ nwunye nwa-gi: nwunye nwa-gi ka ọ bu; ekpughela ọtọ-ya. 16 Ekpughela ọtọ nwunye nwa-nne-gi: ọtọ nwa-nne-gi ka ọ bu. 17 Ekpughela ọtọ nwanyi na nwa ya nwanyi; ekurula nwa-nwanyi nke nwa-ya nwoke, ma-ọbu nwa-nwayi nke nwa ya nwanyi, ikpughe ọtọ-ya; ndi-aru ka ha bu: nzube ọjọ ka ọ bu. 18 Ekuru-kwa-la nwayi tiyere nwa-nne-ya nwayi, ikpab͕u ya, ikpughe ọtọ-ya, tiyere ya na ndu-ya. 19 Abiarula nso nwayi ikpughe ọtọ-ya n'idi-na-nsọ nke ọrurú-ya. 20 Gi na nwunye madu-ibe-gi edinala ka i ra aru n'aru-ya, iwere ya meru onwe-gi. 21 Enye-kwa-la onye ọ bula nime nkpuru-gi ime ka ha gabiga rue Molek, eme-kwa-la ka aha Chineke-gi ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova. 22 Gi na nwoke edinala dika nwoke na nwayi nēdina ihe-árú ka ọ bu. 23 Gi na anumanu ọ bula edina-kwa-la ka i ra aru n'aru-ya, iwere ya meru onwe-gi: nwayi agaghi-eguzo kwa n'iru anumanu iso ya dina; ngwakọta ọjọ ka ọ bu. 24 Unu ewerela ihe ndia nile meru onwe-unu: n'ihi na ewere ihe ndia nile me ka mb͕a nile rua árú, bú ndi Mu onwem nāchupu n'iru unu: 25 ala ahu ru-kwa-ra árú: M'nēwere kwa ajọ emume-ya leta ya, ala ahu nāb͕ọputa kwa ndi bi nime ya. 26 Unu onwe-unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile, ghara kwa ime ihe ọ bula nime ihe-árú ndia nile; ma ọ bu onye amuru n'ala, ma-ọbu ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti unu: 27 (n'ihi na ihe-áru ndia nile ka ndikom nke ala ahu meworo, ndi nọ n'iru unu, ala ahu ru-kwa-ra árú;) 28 ka ala ahu we ghara ib͕ọputa unu mb͕e unu nēmeru ya, dika ọ b͕ọputara mba ahu nke di n'iru unu. 29 N'ihi na onye ọ bula nke nēme ihe ọ bula nime ihe-árú ndia nile, agēbipu nkpuru-obi nile nēme ha n'etiti ndi-ha. 30 Unu gēdebe kwa ihe-ndebem, ka unu we ghara ime ihe ọ bula nime ukpuru ihe-árú ndia, nke anēmeri n'iru unu, ka unu we ghara kwa iwere ha meru onwe-unu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria