Ilu 4 - Bible Nso1 Umum, nurunu idọ-aka-na-ntí nke nna, Tọ-kwa-nu nti n'ala ima nghọta: 2 N'ihi na ezi ihe-nmuta ka m'nyeworo unu; Unu arapula iwum. 3 N'ihi na nwa ka m'buru nnam, Di nrò, buru kwa nwa enwere nání ya n'iru nnem. 4 O we zím ihe, sim, Ka obi-gi jide okwum nile; Debe ihe nile m'nyere n'iwu, we di ndu: 5 Nweta amam-ihe, nweta nghọta; Echezọla, esi-kwa-la n'okwu nile nke ọnum wezuga onwe-gi: 6 Arapula ya, ọ gēdebe kwa gi; Hu ya n'anya, ọ gēchebe kwa gi. 7 Isi ihe ka amam-ihe bu; nweta amam-ihe: E, were ihe nile i nwetaworo nweta nghọta. 8 Tukọba ya elu, o gēbuli kwa gi: Ọ gāsọpuru gi, mb͕e i nāb͕aku ya obi. 9 Ọ gēnye isi-gi okpu amara: Okpu-eze mara nma ka ọ gēnye gi n'aka. 10 Nuru, nwam, nara kwa okwu-ọnum nile; Arọ ndu gāba-kwa-ra gi uba. 11 N'uzọ amam-ihe ka m'zíworo gi ihe; Emewom ka i zọ ije n'uzọ nile nke izi-ezi. 12 Mb͕e i nēje ije, agaghi-akpagide nzọ-ukwu-gi; Ọ buru kwa na i b͕a ọsọ, i gaghi-asu ngọngọ. 13 Jide idọ-aka-na-nti aka; arala ya aka: Chebe ya; n'ihi na ya onwe-ya bu ndu-gi. 14 Abàla n'okporo-uzọ ndi nēmebi iwu, Aga-kwa-la n'iru n'uzọ ndi ọjọ. 15 Zere ya, agabigala nime ya; Wezugara ya onwe-gi, gabiga. 16 N'ihi na ha adighi-araru ura, ọ buru na ha adighi-eme ihe ọjọ; Anapuwo kwa ura-ha n'ike, ọ buru na ha adighi-eme ka madu su ngọngọ. 17 N'ihi na ha eriwo nri nke nmebi-iwu, Ọ bu kwa manya nke ihe-ike ka ha nāṅu. 18 Ma okporo-uzọ ndi ezi omume di ka ìhè nēnwu enwu, Nke nāmu aga n'iru n'iru rue mb͕e chi bọchara. 19 Uzọ ndi nēmebi iwu di ka ọchichiri: Ha amaghi ihe ọ bu ha ji asu ngọngọ. 20 Nwam, ṅa nti n'okwum nile; Tọ nti-gi n'ala n'okwu-ọnum nile. 21 Ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha; Debe ha n'etiti obi-gi. 22 N'ihi na ndu ka ha buru ndi nachọta ha, Ha bu kwa ihe nāgwọ anu-aru-ha nile. 23 Kari ihe-ndebe-gi nile chebe obi-gi; N'ihi na site na ya ka nputa nile nke ndu di. 24 Si n'ebe i nọ wezuga ọnu nēkwu ihe b͕agọrọ ab͕agọ, Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuhie ekwuhie di anya n'ebe i nọ. 25 Ka anya-gi abua legide n'iru, Ka mbubere-anya-gi lezi kwa n'iru gi. 26 Me ka okporo-uzọ nke ukwu-gi abua di lari, Ka edozi kwa uzọ-gi nile. 27 Ewezugala onwe-gi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe: Si n'ihe ọjọ wezuga ukwu-gi. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria