Ilu 3 - Bible Nso1 Nwam, echezọla iwum; Ma ka obi-gi chebe ihe nile m'nyere n'iwu: 2 N'ihi na ubọchi ndu nke di ogologo, na ọtutu arọ nke ndu, Na udo, ka ha gātukwasiri gi. 3 Ekwela ka ebere na ezi-okwu rapu gi: Ke ha n'olu-gi; De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi: 4 Chọta kwa amara na ezi uche N'anya Chineke na madu. 5 Tukwasi Jehova obi-gi nile, Adabere-kwa-la nghọta-gi: 6 N'uzọ-gi nile mara Ya, Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi. 7 Abula onye mara ihe n'anya gi onwe-gi; Tua egwu Jehova, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi: 8 Ya buru ihe nāgwọ otubo-gi, Ya buru kwa umi diri ọkpukpu-gi nile. 9 Sọpuru Jehova site n'àkù-gi, Site kwa na nkpuru mbu nke ihe-ọmume-gi nile: 10 Ọba-gi nile gējuputa kwa n'ihe-nriju-afọ, Ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi nile gētiwa kwa na manya-vine ọhu. 11 Nwam, ajula idọ-aka-na-nti nke Jehova: Ike agwu-kwa-la gi n'iba-nba-Ya: 12 N'ihi na onye Jehova nāhu n'anya ka Ọ nābara nba; Ọbuná dika nna si abara nwa-ya nke ihe-ya nātọ ya utọ nba. 13 Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke chọtaworo amam-ihe bu, Ya na madu nke nēnweputa nghọta. 14 N'ihi na ọzuzú-ahia-ya di nma kari ọzuzú-ahia ọla-ọcha, Urù-ya di nma kari ọla-edo ọma. 15 Ihe di oké ọnu-ahia ka ọ bu kari ruby: Ihe nile kwa nke nātọ gi utọ, ha agaghi-ara ka ya. 16 Ubọchi ndu di ogologo di n'aka-nri-ya; N'aka-ekpe-ya ka àkù na nsọpuru di. 17 Uzọ-ya nile bu uzọ nke idi-utọ, Okporo-uzọ-ya nile bu kwa udo. 18 Osisi nēnye ndu ka ọ buru ndi nējide ya aka: E, onye ọ bula nke nējisi ya aka ike bu onye ihe nāgara nke-ọma. 19 Jehova jiri amam-ihe tọ ntọ-ala uwa; O doziri elu-igwe site na nghọta. 20 Ejiri ihe-ọmuma-Ya kewa ob͕u-miri nile, Mbara-ígwé nile ji kwa ya atuda igirigi. 21 Nwam, ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha; Chebe nzube-ihe na ìzùzù; 22 Ha gābu-kwa-ra nkpuru-obi-gi ndu, Bu-kwa-ra olu-gi amara. 23 Mb͕e ahu ka i ganēje ije n'uzọ-gi na ntukwasi-obi, I gaghi-akpọbì kwa ukwu-gi, 24 Ọ buru na i dina ala, i gaghi-atu oké egwu: E, i gēdina ala, ura-gi gātọ kwa utọ. 25 Atula egwu site n'oké egwu mberede, Ma-ọbu site n'ikuku siri ike nke ndi nēmebi iwu, mb͕e ọ nābia: 26 N'ihi na Jehova gābu ntukwasi-obi-gi, Ọ gēdebe kwa ukwu-gi ka aghara ijide ya. 27 Eb͕ochila ezi ihe na ndi ọ diri, Mb͕e ọ diri ike aka-gi ime ya. 28 Asila madu-ibe-gi, Je, lata, Echi ka m'gēnye gi; Mb͕e ọ di n'aka-gi. 29 Echèputala ihe ọjọ megide madu-ibe-gi, Ebe onye ahu nēbi gi nso na ntukwasi-obi. 30 Gi na madu esela okwu n'efu, Ma ọ buru na o mesoghi gi ihe ọjọ. 31 Ekwosola onye neme ihe-ike ekworo, Arọputa-kwa-la otù efu n'uzọ-ya nile. 32 N'ihi na ihe-árú n'anya Jehova ka onye sihiere esihie bu: Ma n'aka ndi ziri ezi ka ìzù nzuzo Ya di. 33 Ọbubu-ọnu Jehova di n'ulo onye nēmebi iwu; Ma ebe-obibi ndi ezi omume ka Ọ nāgọzi. 34 Ọ buru na ọ bu ndi nākwa emò ka Ya onwe-ya nākwa emò, Ma ọ bu ndi di ume-ala n'obi ka Ọ nēnye amara. 35 Nsọpuru ka ndi mara ihe gēketa; Ma ndi-nzuzu nēbuli nlelì. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria